YouVersion Logo
Search Icon

2 Ihe E Mere Ihe dị nʼime ya

Ihe dị nʼime ya
Ihe dị nʼime ya:
Akwụkwọ Ihe e mere nke abụọ kọrọ akụkọ ihe mere nʼala Juda. Ọ malitere akụkọ a nʼebe Akwụkwọ Ihe e mere nke mbụ kwụsịrị. A kọrọ akụkọ banyere ịdị ebube nke ọchịchị Solomọn, eze Izrel, kọọkwa ihe gbasara ịdị ebube nke ụlọnsọ ukwu. A kọkwara akụkọ banyere ihe mere nʼoge ndị eze Juda ndị ọzọ chịrị, rụtụ aka nʼihe gbasara ọnọdụ ife ofufe dị iche iche nʼoge ọchịchị eze ndị a. A kpọtụrụ Hezekaya bụ eze aha, nye ya ọnọdụ pụrụ iche nʼakwụkwọ a nʼihi na ọ bụ nʼoge ọchịchị ya ka enwere ntute dị ukwuu nʼala Juda. Akụkọ ọzọ a kọrọ nʼakwụkwọ a metụtara mbibi e bibiri Jerusalem, na ndọta nʼagha nke ndị agha Babilọn dọtara ndị Juda. Ihe e ji mechie akwụkwọ a bụ akụkọ banyere iwu nke eze ndị Peshịa nyere maka ịhapụ ndị Juda a dọtara nʼagha ka ha laghachi nʼala ha.
Usoro e si dee ya:
Ọchịchị Solomọn 1
Owuwu na ido ụlọnsọ ukwu nsọ 2–7
Ịdị ebube nke ọchịchị Solomọn 8–9
Ndị eze ndị ọzọ chịrị na Juda 10–36

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in