1 Samuel 11
11
Mmeri Sọl meriri ndị Amọn
1Nʼoge ahụ, Nahash, eze ndị Amọn,#11:1 Ndị Amọn bụ ụmụ ụmụ Lọt, Jen 19:38; Dit 2:19 nʼoge Ndị Ikpe na-achị nʼIzrel, ha gbalịrị ibuso ha agha ka ha nara ha ala ha. Nkp 3:13; 11:4-33 duuru ndị agha ya bilie imegide ndị Izrel bi nʼala Jebesh Gilead. Ma ndị Jebesh rịọrọ ya sị, “Ka anyị na gị gbaa ndụ, anyị ga-anọ nʼokpuru ọchịchị gị.”
2Ma Nahash, onye Amọn zara sị ha, “Mụ na unu ga-agba ndụ ma ọ bụrụ na unu ekwenye ka m ghụpụta anya aka nri nke onye ọbụla nʼime unu, si otu a wetara Izrel niile ihe nkọcha.”
3Ndị okenye obodo Jebesh zara sị, “Nye anyị abalị asaa ka anyị ziga ndị ozi nʼala Izrel niile. Ọ bụrụ na o nweghị onye kwere ịbịa zọpụta anyị, anyị ga-ewere onwe anyị nyefee gị nʼaka.”
4Mgbe ndị ozi ha zipụrụ bịaruru Gibea, nke bụ obodo Sọl, ha kọọrọ ndị mmadụ ihe ndị a, ha niile dapụrụ nʼakwa. 5Ma nʼoge a, Sọl si nʼubi na-alọta, soro ụmụ ehi ya nʼazụ, ọ jụrụ, “Ọ bụ gịnị na-eme onye ọbụla? Gịnị mere na ha ji ebe akwa?” Ha kọọrọ ya ihe banyere ozi e si Jebesh zite.
6Mgbe Sọl nụrụ ozi a, Mmụọ nke Chineke bịakwasịrị ya nʼike, iwe wekwara ya nke ukwuu. 7Ọ kpụpụtara ehi abụọ bọkasịa ha, zipụ ndị ozi ka ha buru ha ga obodo niile dị nʼIzrel. Ozi ha ga-ezi ndị obodo ọbụla bụ nke a. “Ọ bụ ihe e mere ehi ndị a ka a ga-eme ehi onye ọbụla jụrụ iso Sọl na Samuel jee ọgụ.” Onyenwe anyị mere ka egwu jide ndị Izrel niile. Nʼihi ya, ha niile bịakwutere Sọl dịka otu mmadụ. 8Mgbe Sọl kpọkọtara ha na Bezek, ọnụọgụgụ ndị ikom Izrel dị narị puku atọ, tinyekwara iri puku mmadụ atọ, ndị sitere na Juda.
9Ha gwara ndị zitere ozi ahụ okwu sị ha, “Zienụ ndị ikom Jebesh Gilead, ‘Echi, tupu anyanwụ achaa nʼuju ya, a ga-anapụta unu.’ ” Mgbe ndị ozi a gara zie ndị ikom Jebesh Gilead ozi a, ha ṅụrịrị ọṅụ nke ukwuu. 10Ndị ikom Jebesh ziri ozi gwa ndị Amọn sị ha, “Echi, anyị ga-enye unu onwe anyị, ka unu mee anyị ihe masịrị unu.”
11Ma nʼụtụtụ echi, Sọl na ndị agha ya bịaruru. O kewara ndị agha ya ụzọ atọ, buso ụmụ Amọn agha na mberede nʼisi ụtụtụ. O gbugidere ha ụtụtụ niile ruo mgbe anyanwụ chara nʼuju ya, chụsasịa ndị fọdụrụ nʼime ha. Nke a mere na o nweghị ebe a ga-ahụ ka ndị agha Amọn abụọ nọkọtara.
Nnabata Sọl dịka eze
12Ndị Izrel niile bịakwutere Samuel jụọ ya sị, “Olee ndị ahụ sị na Sọl agaghị abụ eze anyị? Kpọpụtara anyị ha ka anyị gbuo ha!”
13Ma Sọl zara sị, “O nweghị onye ọbụla a ga-egbu taa, nʼihi na taa, Onyenwe anyị anapụtala Izrel!”
14Samuel gwara ha sị, “Bịanụ ka anyị gaa Gilgal mee ịbụ eze a ka ọ dị ọhụrụ ọzọ.” 15Ya mere, mmadụ niile gara Gilgal. Na mmemme pụrụ iche, ha mere Sọl eze nʼihu Onyenwe anyị. Ha chụkwara aja udo nye Onyenwe anyị nʼebe ahụ. Ọṅụ jupụtakwara nʼobi Sọl na ndị Izrel niile.
Currently Selected:
1 Samuel 11: BIU
Highlight
Share
Copy
Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in
Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a™
Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020
Ọ bụ ndị Biblica, Inc. nyere ikike idenye amaokwu ndị a.
Ikike a dị nye ndị Biblica, Inc. nʼụwa niile.
――――――
Igbo Contemporary Bible™
Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc.
Used with permission. All rights reserved worldwide.