YouVersion Logo
Search Icon

1 Ndị Eze Ihe dị nʼime ya

Ihe dị nʼime ya
Ihe dị nʼime ya:
Akwụkwọ Ndị Eze nke mbụ na nke abụọ bụ otu akwụkwọ. Akụkọ a kọrọ nʼime ha bụ ihe mezuru nʼala Izrel nʼime narị afọ atọ na iri afọ ise mgbe ndị eze dị iche iche chịrị ala ahụ. Ọ bụ nke a mere e ji kpọọ akwụkwọ ndị a Akwụkwọ Ndị Eze. Akụkọ dị nʼakwụkwọ ndị Eze nke mbụ malitere site na mgbe Devid nwụrụ. A kọrọ nʼime ya akụkọ gbasara ọchịchị eze Solomọn, ya na owuwu e wuru ụlọnsọ ukwu Chineke ahụ dị na Jerusalem. Nkewa alaeze Izrel ụzọ abụọ, otu nʼakụkụ ugwu, nke ọzọ na ndịda, ka a kọkwara akụkọ ha. Ihe e ji mechie akwụkwọ Ndị Eze nke mbụ bụ akụkọ banyere esemokwu dapụtara nʼetiti Ịlaịja onye amụma na Ehab, eze Izrel.
Usoro e si dee ya:
Ọnwụ Devid 1:1–2:11
Ọchịchị Solomọn 2:12–11:43
Nkewa alaeze Izrel 12:1-24
Akụkọ gbasara ọchịchị alaeze Juda na Izrel 12:25–16:28
Ịlaịja na Ehab 16:29–22:40
Ọchịchị Jehoshafat na Ahazaya 22:41-53

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in