1
Abụ Ọma 34:18
Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a
ONYENWE ANYị na-anọ ndị niile obi ha tiwara etiwa nso, ọ na-anapụta ndị niile olileanya ha gwụrụ.
Compare
Explore Abụ Ọma 34:18
2
Abụ Ọma 34:4
Nʼihi na etikuru m ONYENWE ANYị mkpu akwa, ọ zakwara m, napụta m site nʼaka ịtụ ụjọ m niile.
Explore Abụ Ọma 34:4
3
Abụ Ọma 34:19
Nsogbu na-adakwasị ndị ezi omume na-adị ukwuu, ma ONYENWE ANYị na-anapụta ha site na nsogbu ndị ahụ niile.
Explore Abụ Ọma 34:19
4
Abụ Ọma 34:8
Jiri aka gị tulee ma hụkwa na ONYENWE ANYị dị mma; onye a gọziri agọzi ka onye ahụ bụ, onye nke na-agbaba nʼime ya.
Explore Abụ Ọma 34:8
5
Abụ Ọma 34:5
Ihu ndị na-elekwasị ya anya na-enwu dịka ihe; ihere adịghị eme ha.
Explore Abụ Ọma 34:5
6
Abụ Ọma 34:17
ONYENWE ANYị na-anụ olu ndị ezi omume, mgbe ha na-akpọku ya ka o nyere ha aka; ọ na-azọpụtakwa ha site na nsogbu ha niile.
Explore Abụ Ọma 34:17
7
Abụ Ọma 34:7
Mmụọ ozi ONYENWE ANYị na-agba ndị niile na-atụ egwu ya gburugburu na-anapụtakwa ha.
Explore Abụ Ọma 34:7
8
Abụ Ọma 34:14
Site nʼihe ọjọọ wezuga onwe gị ma mee ezi ihe, chọọ udo ma gbasookwa ya.
Explore Abụ Ọma 34:14
9
Abụ Ọma 34:13
chezie ire gị ka ọ ghara ikwu ihe ọjọọ, chezikwaa egbugbere ọnụ gị ka ọ gharakwa ịgha ụgha.
Explore Abụ Ọma 34:13
10
Abụ Ọma 34:15
Anya ONYENWE ANYị dị nʼahụ ndị ezi omume, ntị ya gheekwa oghe nye mkpu akwa ha
Explore Abụ Ọma 34:15
11
Abụ Ọma 34:3
Soro m too ONYENWE ANYị; ka anyị bulie aha ya elu.
Explore Abụ Ọma 34:3
Home
Bible
Plans
Videos