1
Abụ Ọma 143:10
Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a
Kuziere m ime uche gị, nʼihi na ị bụ Chineke m; ka ezi Mmụọ gị duo m nʼala dị larịị.
Compare
Explore Abụ Ọma 143:10
2
Abụ Ọma 143:8
Mee ka m nụrụ okwu ịhụnanya gị nke na-adịghị agharịpụ nʼisi ụtụtụ, nʼihi na ọ bụ gị ka m tụkwasịrị obi. Zi m ụzọ m kwesiri ịgbaso, nʼihi na ọ bụ gị ka m na-eweli mkpụrụobi m nye.
Explore Abụ Ọma 143:8
3
Abụ Ọma 143:9
O ONYENWE ANYị, gbapụta m site nʼaka ndị iro m, nʼihi na ọ bụ nʼime gị ka m na-ezo onwe m.
Explore Abụ Ọma 143:9
4
Abụ Ọma 143:11
O ONYENWE ANYị, nʼihi aha gị chebe ndụ m; nʼime ezi omume gị, napụta m site na nsogbu.
Explore Abụ Ọma 143:11
5
Abụ Ọma 143:1
O ONYENWE ANYị, nụrụ ekpere m, gekwaa ntị nʼakwa arịrịọ m maka amara; nʼihi ikwesi ntụkwasị obi gị na ezi omume gị, bịa nyere m aka.
Explore Abụ Ọma 143:1
6
Abụ Ọma 143:7
O ONYENWE ANYị, zaa m ọsịịsọ; mmụọ m na-ada mba. Ezonarịla m ihu gị, ma ọ bụghị ya, aga m adị ka ndị na-arịda ruo nʼili.
Explore Abụ Ọma 143:7
7
Abụ Ọma 143:5
Ana m echeta ụbọchị niile ndị ahụ gara aga; ana m atụgharị uche nʼọrụ gị niile na-echekwa echiche banyere ihe niile aka gị rụrụ.
Explore Abụ Ọma 143:5
Home
Bible
Plans
Videos