Bezalel ji osisi akashia wuo igbe ọgbụgba ndụ nke ịdị ogologo ya bụ otu mita na sentimita iri. Obosara ya ga-abụ sentimita iri isii na asatọ. Ịla elu ya ga-abụkwa sentimita iri isii na asatọ. O ji ọlaedo a nụchara anụcha machie nʼime na azụ ya, jirikwa ọlaedo kpụọ ihe gburugburu akụkụ ya niile.