1
Jenesis 25:23
Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a
ONYENWE ANYị gwara ya sị, “Mba abụọ dị gị nʼafọ, ụzọ mba abụọ dị nʼime gị ka a ga-ekewa. Otu ụzọ ga-adị ike karịa nke ọzọ, nke okenye ga-ejere nke nta ozi.”
နှိုင်းယှဉ်
Jenesis 25:23ရှာဖွေလေ့လာလိုက်ပါ။
2
Jenesis 25:30
Ịsọ rịọrọ Jekọb sị, “Nyetụ m ụfọdụ nʼime nri a na-acha uhie uhie ị na-esi ka m rie, nʼihi na agụụ na-agụ m hie nne.” (Ọ bụ ihe a mere e ji na-akpọ ya Edọm.)
Jenesis 25:30ရှာဖွေလေ့လာလိုက်ပါ။
3
Jenesis 25:21
Aịzik kpere ekpere rịọọ ONYENWE ANYị ka o nye nwunye ya nwa nʼihi na ọ bụ nwanyị aga. ONYENWE ANYị zara ekpere ya. Nwunye ya, Ribeka dịịrị ime.
Jenesis 25:21ရှာဖွေလေ့လာလိုက်ပါ။
4
Jenesis 25:32-33
Ịsọ sịrị, “Gịnị bụ uru ọnọdụ ịbụ ọkpara bara mgbe m na-anwụ nʼagụụ?” Jekọb sịrị ya, “Buru ụzọ ṅụọrọ m iyi.” Ya mere, ọ ṅụụrụ ya iyi, sị otu a resi Jekọb ọnọdụ ọkpara ya.
Jenesis 25:32-33ရှာဖွေလေ့လာလိုက်ပါ။
5
Jenesis 25:26
Emesịa, nwanne ya pụtara, ma aka ya jidere ikiri ụkwụ Ịsọ. Nʼihi ya, a kpọrọ aha ya Jekọb. Aịzik gbara iri afọ isii mgbe Ribeka mụrụ ha.
Jenesis 25:26ရှာဖွေလေ့လာလိုက်ပါ။
6
Jenesis 25:28
Aịzik hụrụ Ịsọ nʼanya nʼihi na ụtọ anụ Ịsọ na-egbute nʼọhịa na-adị ya mma, ma Ribeka hụrụ Jekọb nʼanya.
Jenesis 25:28ရှာဖွေလေ့လာလိုက်ပါ။
ပင်မစာမျက်နှာ
ကျမ်းစာ
အစီအစဉ်
ဗီဒီယို