n'ihi nka agughm onwem onye kwesiri ibiakute Gi: kama were okwu-ọnu kwue, agēme kwa ka aru onye nējerem ozi di ike. N'ihi na mu onwem bu kwa onye edoro n'okpuru ike, nēnwe ndi-agha n'okpuru mu onwem: m'we si onye a, Ga, ọ ga; m'si kwa onye ọzọ, Bia, ọ bia; m'si kwa orùm, Me nka, o me ya. Ma mb͕e Jisus nuru ihe ndia, o juru Ya anya n'ihi ya, o we chigharia, si ìgwè madu nke nēso Ya, Asim unu, ọ dighi mb͕e M'huru oké okwukwe di otú a, ọbuná n'Israel.