ABÙ NKE ABÙ 5:1
ABÙ NKE ABÙ 5:1 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Abatala m nʼubi m a gbara ogige, nwanne m nwanyị, nwunye ọhụrụ m. Achịkọtala m máá ya na ụda m, arachakwala m mmanụ aṅụ m na ugbugbo mmanụ aṅụ. Aṅụkwala m mmiri ara ehi na mmanya m. Rie, ṅụọkwa, unu ndị bụ enyi; ṅụjuo afọ, unu ndị hụrụ onwe unu nʼanya.
Kesaa
Gụọ ABÙ NKE ABÙ 5ABÙ NKE ABÙ 5:1 Bible Nso (IGBOB)
Abatawom n'ubim ab͕ara ogige, nwa-nnem nwayi, nwunye ọhu nkem: Aghọrọwom myrrh nkem, ya na udam; Arachawom ub͕ub͕ọ-manu-aṅum, ya na manu-aṅum; Aṅuwom manya-vine nkem, ya na miri-ara-ehim. Rienu ihe, ndi-eyim; Ṅuanu ihe-ọṅuṅu, e, ṅujuenu afọ unu ndi ihe-unu nātọm utọ.
Kesaa
Gụọ ABÙ NKE ABÙ 5