ILU 9:10-18
ILU 9:10-18 Bible Nso (IGBOB)
Nmalite amam-ihe ka egwu Jehova bu: Ihe-ọmuma nke Onye Nsọ bu kwa nghọta. N'ihi na site na mu ka ubọchi-gi gāba uba, Agātukwasi-kwa-ra gi arọ ndu. Ọ buru na i mara ihe, i maworo onwe-gi ihe: Ọ buru kwa na i kwa emò, nání gi gēbu ya. Nwanyi nzuzu nēme nkpọtu; Onye nēnweghi uche ka ọ bu, ọ maghi kwa ihe ọ bula. Ọ nānọdu kwa n'ọnu-uzọ ulo-ya, N'elu oche n'ebe nile di elu nke obodo, Ikpọ ndi nāgabiga n'uzọ òkù, Bú ndi nāgazi agazi n'okporo-uzọ-ha, Onye ọ bula nēnweghi uche, ya wezuga onwe-ya bata n'ebe a: Ọzọ, onye obi amam-ihe kọrọ, nwanyi ahu asiwo ya, Miri ezutara ezuta nātọ utọ, Nri eriri na nzuzo di utọ. Ma nwoke ahu amaghi na ndi nādighi ndu nọ n'ebe ahu; Na ọ bu n'ebe nile miri emi nke ala-mọ ka ndi ọ kpọrọ nọ.
ILU 9:10-18 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Nʼihi na ịtụ egwu ONYENWE ANYị bụ mmalite amamihe, inwe ihe ọmụma banyere onye Nsọ ahụ bụkwa nghọta. Nʼihi na ọ bụ site na amamihe, ka ụbọchị gị ga-adị ogologo. A ga-etinyekwara gị ọtụtụ afọ na ndụ gị. Ị bụrụ onye nwere amamihe, amamihe gị ga-abara gị uru, ma ị bụrụ onye na-akwa emo, naanị gị ga-ata ahụhụ ya. Nwanyị dị nzuzu na-eme mkpọtụ, o nweghị uche; ihere adịghịkwa eme ya. Ọ na-anọ ọdụ nʼọnụ ụzọ ụlọ ya, nʼelu oche nʼebe dịkarịsịrị elu nʼobodo, na-akpọ ndị na-aga nʼụzọ oku, bụ ndị na-aga mkpa ha, “Ka ndị niile amamihe kọrọ bịa nʼụlọ m.” Ọ na-asịkwa ndị na-enweghị uche, “Mmiri e zutere nʼohi na-atọ ụtọ, nri e riri na nzuzo na-atọkarịkwa nʼụtọ.” Ma ha adịghị aghọta na ndị nʼadịghị ndụ nọ nʼebe ahụ, na ndị ọ kpọrọ oku nri aghọọlarị ndị nọ nʼala mmụọ.