Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

JEREMAIA 4:1-18

JEREMAIA 4:1-18 Bible Nso (IGBOB)

Ọ buru na i gālata, gi Israel, (ọ bu ihe si nọnu Jehova puta), Mu ka i gālaghachikute: ọ buru kwa na i gēwezuga ihe-árú-gi nile n'irum, i gaghi-awaghari; i gāṅu kwa iyi, Jehova nādi ndu, n'ezi-okwu, na n'ikpé ziri ezi, na n'ezi omume; mba nile gāgọzi kwa onwe-ha nime Ya, ọ bu kwa nime Ya ka ha gānya isi. N'ihi na otú a ka Jehova siri ndikom Juda, si kwa Jerusalem, Lucharanu onwe-unu ubi, unu agha-kwa-la nkpuru n'etiti ogwu. Bìenu onwe-unu úgwù nye Jehova, bìenu onwe-unu úgwù n'obi, unu ndikom Juda na ndi bi na Jerusalem: ka ọnuma m we ghara ipu dika ọku, we re nke ọ nādighi onye nēmenyu, site n'ihe ọjọ nke omume nile unu. Gosinu na Juda, me-kwa-nu ka anuru ya na Jerusalem; si-kwa-nu, Fùanu opì-ike n'ala nka: kpọzuenu nkpu, si, Chikọtanu onwe-unu, ka ayi ba kwa n'obodo nile ewusiri ike. Bulienu ọkọlọtọ n'uzọ Zaion: latanu n'ulo ọsọsọ, unu eguzola: n'ihi na ihe ọjọ ka Mu onwem nēme ka o si n'Ugwu bia, ya na ntipia uku. Ọdum esiwo n'alughi-ulù-ya rigo, bú onye nēbibi mba di iche iche; o buliwo ije-ya, o siwo n'ọnọdu-ya puta; ime ka ala-gi ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu; obodo-gi nile gāghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu, ghara inwe onye-obibi. N'ihi nka kenu ákwà-nkpe n'úkwù-unu, tienu aka n'obi, kwasi kwa ákwá ike: n'ihi na iwe di ọku nke Jehova esighi n'aru ayi laghachi. O gēru kwa n'ubọchi ahu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), na obi eze gāla n'iyì, ya na obi ndi-isi; ibobo gānwu kwa ndi-nchu-aja n'aru, ọ gāb͕agwoju kwa ndi-amuma anya. M'we si, Ewó, Onye-nwe-ayi Jehova! n'ezie I rafuwo ndi nka na Jerusalem nke-uku, si, Udo gādiri unu, ma mma-agha emetuwo nkpuru-obi aru. Na mb͕e ahu ka agāsi ndi nka, si kwa Jerusalem, Ifufe di ọku, nke sitere n'ebe di elu nke ọhia nādighi ya nke di n'ọzara, nēfe n'uzọ ada ndim, ọ bughi ifucha afucha, ọ bughi kwa ime ka adi ọcha; ifufe nke juru eju nke sitere n'ebe ndia gābiaram: ub͕u a Mu onwem gēkwu kwa ọkwu ikpé nile n'ebe ha nọ. Le, dika igwe-oji ka ọ nārigota, ọ bu kwa dika oké ifufe ka ub͕ọ-ala-ya nile di: inyinya-ya nile di garagara kari ugo. Ahuhu gādiri ayi! n'ihi na ebibiwo ayi. Sapu obi-gi n'ihe ọjọ, gi Jerusalem, ka ewe zọputa gi. Rùe ole mb͕e ka i gēme ka ajọ èchìchè-gi nile nọ ọnọdu-abali n'etiti gi? N'ihi na otù olu nēgosi site na Dan, ọ nēme kwa ka anuru ajọ ihe site n'ugwu Efraim: hotaranu mba nile; le, menu ka anuru ya megide Jerusalem, si, na ndi-nche nābia site n'ala di anya, ha we me ka olu-ha da megide obodo nile nke Juda. Dika ndi nēdebe ubi, otú a ka ha nọ nēmegide ya buruburu; n'ihi na Mu ka ọ nupuworo isi n'okpuru, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta. Uzọ-gi na omume-gi nile ewewo gi ihe ndia; nka bu ihe ọjọ gi; n'ihi na ọ di ilu, n'ihi na o rutuwo obi-gi aru.

JEREMAIA 4:1-18 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

“Ọ bụrụ na unu bụ Izrel, ga-alọta, ka ONYENWE ANYị kwubiri, mụ ka ị ga-alọghachikwute,” “Ọ bụrụ na unu ewezuga arụsị ndị ahụ rụrụ arụ site nʼihu m, hapụ isi ebe m nọ kpafuo, ọ bụrụkwa na unu ga-eji eziokwu, ikpe ziri ezi na ụzọ ezi omume ṅụọ iyi sị, ‘Dịka ONYENWE ANYị na-adị ndụ,’ mgbe ahụ mba niile ga-agọzi onwe ha site na ya nyakwaa isi nʼime ya.” Ihe ndị a ka ONYENWE ANYị na-agwa ndị Juda na Jerusalem sị, “Kọzeenụ ala ubi unu nke unu na-akọbeghị; unu akụnyela mkpụrụ ubi unu nʼetiti ogwu. Bienụ onwe unu ugwu nye ONYENWE ANYị, biekwanụ mkpụrụobi unu ugwu, unu ndị Juda na ndị bi na Jerusalem ma ọ bụghị otu a, iwe m ga-abịakwasị unu dịka ọkụ, nʼihi ihe ọjọọ niile unu mere, ọ ga-ere ma ọ dịkwaghị onye ga-emenyụ ya. “Kwupụta ya na Juda, kwusaa ya na Jerusalem sị, ‘Fụọnụ opi nʼala ahụ niile.’ Tienụ mkpu nʼụzọ mmadụ ga-aghọta ya. Gwanụ ndị Juda na Jerusalem ka ha zukọtaa gbaga nʼobodo ndị ahụ niile e wusiri ike. Bulie ihe i gosi ụzọ ị ga Zayọn! Gbaganụ zoo onwe unu. Unu atụfula oge! Lee na mụ onwe m na-ewebata mbibi na ịla nʼiyi site nʼakụkụ ugwu.” Dịka ọdụm si nʼebe o zoro onwe ya amapụta, ka onye a na-ebibi mba niile si abịa. Ọ hapụla ebe obibi ya, na-abịa ịla Juda nʼiyi. Ọ ga-etidasị obodo niile nke Juda, ọ dịkwaghị onye ga-ebi nʼime ha. Ya mere, yikwasịnụ onwe unu uwe mkpe; kwaanụ akwa, tiekwanụ mkpu akwa, nʼihi na ọnụma ONYENWE ANYị esitebeghị nʼebe Juda nọ wezuga onwe ya. “Nʼụbọchị ahụ,” ka ONYENWE ANYị kwupụtara, “Obi ndị eze na ndịisi ọchịchị ga-ada mba; ahụ ga-akpọnwụ ndị nchụaja, otu a kwa, ihe ga-eme ga-eju ndị amụma anya.” Mgbe ahụ ekwuru m sị; “Ewoo, Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYị lee na ị ghọgbuola ndị a na Jerusalem site na ị sị, ‘Unu ga-enwe udo,’ mgbe mma agha dị anyị nʼolu.” Nʼoge ahụ, a ga-agwa ndị a na Jerusalem, “Ifufe dị ọkụ, nke sitere nʼebe dị elu ihe na-adịghị si nʼọzara na-efebata irute ndị m. Ma ọ bụghị ifufe maka ịfụcha, maọbụ ime ka adị ọcha, ọ bụ ifufe nke dị oke ike karịa nke na-esite na mụ. Ugbu a, ana m ekwupụta okwu ikpe m megide ha.” Lee anya, ha na-abịa dịka igwe ojii. Ụgbọala agha ya na-abịa dịka oke ifufe, ịnyịnya ha niile na-agbasikwa ọsọ ike karịa ugo. Ahụhụ dịrị anyị, anyị abụrụla ndị e bibiri ebibi! Anyị abụrụla ndị na-aga ịla nʼiyi! Jerusalem, sachapụ mmehie dị gị nʼobi, ka a zọpụta gị. Ruo ole mgbe ka echiche mmehie ga-ejupụta gị obi? Otu olu na-akpọsa site na Dan, ọ na-akpọsa ịla nʼiyi site nʼugwu niile nke Ifrem. “Gwa mba niile otu a, ha abịala, kpọsaa banyere Jerusalem: ‘Ndị agha ga-agba gị gburugburu na-abịa site nʼala dị anya, na-eti mkpu agha megide obodo niile nke Juda. Ha ga-agbakwa Jerusalem gburugburu dịka ndị agha na-eche ubi a gbara ogige nche, nʼihi na ndị bi nʼime ya enupula isi megide m,’ ” Otu a ka ONYENWE ANYị kwubiri ya. “Ụzọ gị na omume gị niile buteere gị ihe ndị a. Nke a bụ ntaramahụhụ gị. Lee ka o si dị ilu! Lee ka o si emibanye nʼime obi.”