NDI EFESỌS 6:13-17
NDI EFESỌS 6:13-17 Bible Nso (IGBOB)
N'ihi nka chilienu ihe-agha nile nke Chineke, ka unu we pu iguzogide ndi-iro-unu n'ajọ ubọchi, na iguzo, ebe unu luputaworo ihe nile. Ya mere guzonu, mb͕e unu weresiri ezi-okwu ke úkwù-unu, were kwa ihe-agha nke nēb͕ochi obi yikwasi, bú ezi omume, were kwa nkwadebe nke bu ozi ọma nke udo yikwasi n'ukwu-unu; tukwasi ihe nile ndia welienu ọta nke bu okwukwe, nke unu gāpu imenyu àkú-uta nile nēnwu ọku nke ajọ onye ahu nime ya. Nara-kwa-nu okpu-agha nke bu nzọputa, ya na mma-agha nke Mọ Nsọ, nke bu okwu Chineke
NDI EFESỌS 6:13-17 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ya mere, yikwasịnụ ngwa agha niile nke Chineke ka unu nwee ike iguzosi ike mgbe onye iro ahụ ga-alụso unu ọgụ. Ka unu nweekwa ike iguzo ọ bụladị mgbe unu chụghachiri ha azụ. Meenụ ka eziokwu dịrị unu dị ka eriri akwa nke a na-eji ekesi akwa ike, ezi omume bụrụkwa ihe dị mkpa dị ka ihe agha unu ji ekpuchi obi unu. Werenụ njikere nke ikwusa oziọma nke udo yikwasị dị ka akpụkpọ nʼụkwụ unu. Mgbe niile, unu echefula ijide okwukwe unu dị ka ọta nke unu ga-eji kụchapụ àkụ niile na-enwu ọkụ nke ajọ onye ahụ ga-agba nʼebe unu nọ. Nabatanụ nzọpụta dị ka okpu igwe, werekwanụ okwu Chineke dị ka mma agha nke Mmụọ Nsọ na-enye unu.