Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

I. SAMUEL 15:17-31

I. SAMUEL 15:17-31 Bible Nso (IGBOB)

Samuel we si, Ọ bu ezie na onye ntà ka i bu n'anya gi onwe-gi, ma ọ̀ bughi onye-isi ebo nile nke Israel ka emere gi? Jehova we te gi manu ka i buru eze Israel; Jehova we ziga gi ije ije, si, Je wezuga ndi-nmehie ahu, bú ndi Amalek, ka ebibie ha, i gēbuso kwa ha agha rue mb͕e agēme ka ha gwusia. N'ìhi gini kwa ka i nēgeghi nti olu Jehova, kama i dakwasiri ihe-nkwata, we me ihe ọjọ n'anya Jehova? Sọl we si Samuel, N'ezie egewom nti olu Jehova, we je ije ahu nke Jehova zigaram, m'we me ka Egag eze Amalek bia, ma ewezugaram Amalek ka ebibie ya. Ma ndi Israel chiri ufọdu nime ihe-nkwata ichuru Jehova, bú Chineke-gi, àjà, nime Gilgal, bú ìgwè ewu na aturu na ìgwè ehi, isi ihe n'ihe ewezugara ka ebibie ya. Samuel we si, Àjà-nsure-ọku na àjà ọzọ, hà nātọ Jehova utọ dika ige nti olu Jehova? Le, ige nti di nma kari ichu àjà, iṅa nti di nma kari abuba ebulu. N'ihi na nmehie nke iju-ase n'aka ndi-mọ ka nnupu-isi bu, ikpere-arusi na terafim ka isi-ike bu kwa. N'ihi na i juwo okwu Jehova, Ọ juwo kwa gi ka i ghara ibu eze. Sọl we si Samuel, Emehiewom: n'ihi na agabigawom okwu-ọnu Jehova na okwu-gi nile: n'ihi na aturum egwu ndi Israel, we ge nti olu-ha. Ma ub͕u a, biko, b͕aghara nmehiem, sorokwam laghachi, ka m'we kpọ isi ala nye Jehova. Samuel we si Sọl, M'gaghi-esoro gi laghachi: n'ihi na i juwo okwu Jehova, Jehova ajuwo kwa gi ka i ghara ibu eze Israel. Samuel we chigharia ila, ma o jidere ọnu-ọnu uwe-nwuda-ya, o we dọwa. Samuel we si ya, Jehova adọwapuwo ala-eze Israel n'aru gi ta, nye ya madu-ibe-gi, nke di nma kari gi. Ọzọ kwa, Ebube Israel agaghi-ekwu okwu-ugha, Ọ gaghi-echeghari kwa: n'ihi na Ọ bughi madu nke Ọ gēji cheghari. O we si, Emehiewom: biko, sọpurum ub͕u a n'iru ndi-okenye ndim, na n'iru Israel; sorokwam laghachi, ka m'we kpọ isi ala nye Jehova, bú Chineke-gi. Samuel we laghachi soro Sọl n'azu; Sọl we kpọ isi ala nye Jehova.

I. SAMUEL 15:17-31 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Samuel gwara ya sị, “Ọ bụghị ezie nʼagbanyeghị na ị dịrịị ntakịrị nʼanya gị onwe gị, ma ị bụụrụ onyeisi ndị ebo Izrel niile? ONYENWE ANYị tere gị mmanụ ibu eze ndị Izrel. ONYENWE ANYị ziri gị ijere ya ozi, gwa gị sị, ‘Gaa, laa ndị ajọ omume ahụ, bụ ndị Amalek nʼiyi; buso ha agha ruo mgbe ị kpochapụrụ ha niile.’ Gịnị mere i geghị ntị nʼokwu ONYENWE ANYị ime ihe o kwuru? Gịnị mere i ji chụrụ ihe nkwata gaa, si otu a mee ihe dị njọ nʼanya ONYENWE ANYị?” Ma Sọl sịrị ya, “Ma erubeere m ONYENWE ANYị isi. Ejere m ozi ahụ ONYENWE ANYị zigara m. Anwụtara m Agag eze Amalek na ndụ, ma gbuchapụ ndị Amalek niile. Ndị agha sitere nʼihe a kwatara nʼagha were ụfọdụ atụrụ na ehi, bụ ndị kachasị mma nʼetiti ihe ndị ahụ e debere iche maka ịla ha nʼiyi, iji ha chụọrọ ONYENWE ANYị Chineke gị aja na Gilgal.” Ma Samuel sịrị, “Ihe na-atọ ONYENWE ANYị ụtọ ọ bụ onyinye na aja nsure ọkụ dịka nrube isi nye ihe si nʼọnụ ONYENWE ANYị pụta? Nrube isi dị mma karịa ịchụ aja ịṅa ntị dị mma karịa abụba ebule. Nʼihi na nnupu isi dịka mmehie ịgba afa, mpako dịkwa njọ dịka ikpere arụsị. Nʼihi na ị jụla okwu ONYENWE ANYị ya onwe ya ajụkwala gị dịka eze.” Sọl zara Samuel sị ya, “Emehiela m. Nʼezie, enupula m isi na ndụmọdụ gị na nʼiwu ONYENWE ANYị. Ọ bụ nʼihi na m tụrụ egwu ndị Izrel ka m ji mee ihe ha chọrọ. Biko, gbaghara m mmehie m ugbu a, bịakwa soro m ka m gaa fee ONYENWE ANYị ofufe.” Ma Samuel sịrị ya, “Agaghị m eso gị laghachi azụ. Ebe ị jụrụ okwu ONYENWE ANYị, ONYENWE ANYị ajụkwala gị dịka eze ndị Izrel!” Mgbe Samuel tụgharịrị ka o si nʼebe ahụ pụọ, Sọl jidere ya nʼọnụ ọnụ uwe ya ime ka ọ lọghachi azụ, ma uwe ahụ dọwara. Mgbe ahụ, Samuel zara sị ya, “Taa ONYENWE ANYị adọwapụla alaeze Izrel site nʼaka gị were ya nyefee otu nʼime ndị agbataobi gị, onye ka gị mma. Chineke, onye bụ Ebube Izrel, anaghị agha ụgha; ọ nakwaghị agbanwe obi ya, nʼihi na ọ bụghị mmadụ efu!” Ma Sọl malitekwara ịrịọ arịrịọ ọzọ sị, “Emehiela m. Ma, sọpụrụ m ugbu a nʼihu ndị okenye ndị m, na nʼihu ndị Izrel. Lọghachi soro m ka m gaa fee ONYENWE ANYị Chineke gị ofufe.” Ya mere, Samuel kwenyere soro Sọl laghachi, Sọl kpọkwara isiala nye ONYENWE ANYị.