Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

I. SAMUEL 11:1-15

I. SAMUEL 11:1-15 Bible Nso (IGBOB)

Nehash, bú onye Amon, we rigota, ma ulo-ikwū-ya imegide Jebesh-gilead: ndikom nile nke Jebesh we si Nehash, Ka ayi na gi b͕a ndu, ayi gēfè kwa gi òfùfè. Nehash, bú onye Amon, we si ha, Na nka ka mu na unu gāb͕a ndu, n'irukpọ unu anya aka-nri nile; m'gātukwasi kwa ya n'aru Israel nile ka ọ buru ihe-ita-uta. Ndi-okenye Jebesh we si ya, Ra ayi aka ubọchi asa, ka ayi we zisa ndi-ozi n'ókè-ala nile nke Israel: ọ buru kwa na ọ dighi onye nāzọputa ayi, ayi gāpukuru kwa gi. Ndi-ozi ahu we biarue Gibea nke Sọl, kwue okwu ndia na nti ndi Israel: ndi Israel nile we welie olu-ha kwa ákwá. Ma, le, Sọl biara, nēso ìgwè ehi si n'ubi; Sọl we si, Gini nēme ndi Israel na ha nākwa ákwá? Ha we kọrọ ya okwu nile nke ndikom Jebesh. Mọ nke Chineke we dakwasi Sọl n'ike mb͕e ọ nuru okwu ndia, iwe-ya we di ọku nke-uku. O we chiri ehi abua, bọkasia ha, zisa ha n'ókè-ala nile nke Israel n'aka ndi-ozi, si, Onye ọ bula nke nāputaghi iso Sọl na iso Samuel n'azu, otú a ka agēme ehi-ya. Oké egwu nke Jehova we dakwasi ndi Israel, ha we puta dika otù nwoke. O we gukọta ha na Bezek; umu Israel we di orú nnù ndikom orú uzọ na uzọ iri-na-asa, na nnù iri, ndikom Juda di kwa orú nnù ndikom uzọ atọ, na nnù iri-na-ise. Ha we si ndi-ozi biara, Otú a ka unu gāsi ndikom Jebesh-gilead, Echi ka nzọputa gādiri unu, mb͕e anyanwu nēkpo ọku. Ndi-ozi ahu we bia gosi ndikom Jebesh; ha we ṅuria ọṅu. Ndikom Jebesh we si, Echi ka ayi gāpukuru unu, unu gēme kwa ayi dika ihe nile si di nke di nma n'anya-unu. O rue, n'echi-ya, na Sọl doro ndi Israel n'usu atọ; ha we ba n'etiti ọmuma-ulo-ikwū n'iche-nche ututu, tib͕ue Amon rue ikpo-ọku nke ehihie: o rue, na ndi fọduru b͕asara, ọ fọdughi kwa ndikom abua n'otù ebe n'etiti ha. Ndi Israel we si Samuel, Ònye ka ọ bu, bú onye nāsi, Sọl, ọ̀ gābu eze-ayi? nyenu ayi ndikom ahu, ka ayi we me ka ha nwua. Sọl we si, Ọ dighi nwoke agēme ka ọ nwua ta: n'ihi na ta ka Jehova zọputara nzọputa n'Israel. Samuel we si ndi Israel, Bianu, ka ayi jerue Gilgal, me ka ala-eze-unu di ọhu ọzọ n'ebe ahu. Ndi Israel nile we jerue Gilgal; ha we me Sọl eze n'ebe ahu n'iru Jehova nime Gilgal; ha we chua ihe àjà nke àjà-udo n'iru Jehova n'ebe ahu. Sọl na ndikom nile nke Israel we ṅuria ọṅu nke-uku n'ebe ahu.

I. SAMUEL 11:1-15 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Nʼoge ahụ, Nahash, eze ndị Amọn, duuru ndị agha ya bilie imegide ndị Izrel bi nʼala Jebesh Gilead. Ma ndị Jebesh rịọrọ ya sị, “Ka anyị na gị gbaa ndụ, anyị ga-anọ nʼokpuru ọchịchị gị.” Ma Nahash, onye Amọn zara sị ha, “Mụ na unu ga-agba ndụ ma ọ bụrụ na unu ekwenye ka m ghụpụta anya aka nri nke onye ọbụla nʼime unu, si otu a wetara Izrel niile ihe nkọcha.” Ndị okenye obodo Jebesh zara sị, “Nye anyị abalị asaa ka anyị ziga ndị ozi nʼala Izrel niile. Ọ bụrụ na o nweghị onye kwere ịbịa zọpụta anyị, anyị ga-ewere onwe anyị nyefee gị nʼaka.” Mgbe ndị ozi ha zipụrụ bịaruru Gibea, nke bụ obodo Sọl, ha kọọrọ ndị mmadụ ihe ndị a, ha niile dapụrụ nʼakwa. Ma nʼoge a, Sọl si nʼubi na-alọta, soro ụmụ ehi ya nʼazụ, ọ jụrụ, “Ọ bụ gịnị na-eme onye ọbụla? Gịnị mere na ha ji ebe akwa?” Ha kọọrọ ya ihe banyere ozi e si Jebesh zite. Mgbe Sọl nụrụ ozi a, Mmụọ nke Chineke bịakwasịrị ya nʼike, iwe wekwara ya nke ukwuu. Ọ kpụpụtara ehi abụọ bọkasịa ha, zipụ ndị ozi ka ha buru ha ga obodo niile dị nʼIzrel. Ozi ha ga-ezi ndị obodo ọbụla bụ nke a. “Ọ bụ ihe e mere ehi ndị a ka a ga-eme ehi onye ọbụla jụrụ iso Sọl na Samuel jee ọgụ.” ONYENWE ANYị mere ka egwu jide ndị Izrel niile. Nʼihi ya, ha niile bịakwutere Sọl dịka otu mmadụ. Mgbe Sọl kpọkọtara ha na Bezek, ọnụọgụgụ ndị ikom Izrel dị narị puku atọ, tinyekwara iri puku mmadụ atọ, ndị sitere na Juda. Ha gwara ndị zitere ozi ahụ okwu sị ha, “Zienụ ndị ikom Jebesh Gilead, ‘Echi, tupu anyanwụ achaa nʼuju ya, a ga-anapụta unu.’ ” Mgbe ndị ozi a gara zie ndị ikom Jebesh Gilead ozi a, ha ṅụrịrị ọṅụ nke ukwuu. Ndị ikom Jebesh ziri ozi gwa ndị Amọn sị ha, “Echi, anyị ga-enye unu onwe anyị, ka unu mee anyị ihe masịrị unu.” Ma nʼụtụtụ echi, Sọl na ndị agha ya bịaruru. O kewara ndị agha ya ụzọ atọ, buso ụmụ Amọn agha na mberede nʼisi ụtụtụ. O gbugidere ha ụtụtụ niile ruo mgbe anyanwụ chara nʼuju ya, chụsasịa ndị fọdụrụ nʼime ha. Nke a mere na o nweghị ebe a ga-ahụ ka ndị agha Amọn abụọ nọkọtara. Ndị Izrel niile bịakwutere Samuel jụọ ya sị, “Olee ndị ahụ sị na Sọl agaghị abụ eze anyị? Kpọpụtara anyị ha ka anyị gbuo ha!” Ma Sọl zara sị, “O nweghị onye ọbụla a ga-egbu taa, nʼihi na taa, ONYENWE ANYị anapụtala Izrel!” Samuel gwara ha sị, “Bịanụ ka anyị gaa Gilgal mee ịbụ eze a ka ọ dị ọhụrụ ọzọ.” Ya mere, mmadụ niile gara Gilgal. Na mmemme pụrụ iche, ha mere Sọl eze nʼihu ONYENWE ANYị. Ha chụkwara aja udo nye ONYENWE ANYị nʼebe ahụ. Ọṅụ jupụtakwara nʼobi Sọl na ndị Izrel niile.