Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

I. NDI-EZE 6:1-13

I. NDI-EZE 6:1-13 Bible Nso (IGBOB)

O rue, n'arọ nke-nnù-na-ọgu-anọ site na mb͕e umu Israel siri n'ala Ijipt putasia, n'arọ nke-anọ nke Solomon bu eze Israel, n'ọnwa Ziv, nke bu ọnwa nke-abua, na o wubere Jehova ulo. Ma ulo ahu nke eze, bú Solomon, wuru Jehova, ọgu cubit atọ ka ogologo-ya di, orú cubit ka obosara-ya di, orú cubit na iri ka idi-elu-ya di. Uzọ-nbata kwa nke di n'iru ulo uku nke ulo ahu, orú cubit ka ogologo-ya di, n'iru obosara ulo ahu; cubit iri ka obosara-ya di n'iru ulo ahu. O we mere ulo ahu window ufọdu di obosara nime, kpa kwa nkpa n'èzi. O wu-kwa-ra okpukpu-ulo n'akuku mb͕idi ulo ahu buruburu, bú mb͕idi nile nke ulo ahu buruburu, ma nke ulo uku Chineke ahu, ma nke ime-ime-ulo ahu: o me-kwa-ra ulo ntà nke akuku buruburu: Okpukpu-ulo nke dikarisiri ala, cubit ise ka obosara-ya di, okpukpu-ulo nke-etiti kwa, cubit isi ka obosara-ya di, okpukpu-ulo nke-atọ kwa, cubit asa ka obosara-ya di: n'ihi na o tiyere ngwe n'ulo ahu buruburu n'èzí, ka ihe we ghara ibà na mb͕idi ulo ahu. Ulo ahu, mb͕e anēwu ya, eji nkume nke awazuru awazu mb͕e ebutere ya wue ya: anughi kwa otùtù ma-ọbu anyu-ike ma-ọbu ihe-ọlu ọ bula nke ígwè n'ulo ahu, mb͕e anēwu ya. Ọnu-uzọ nke ulo ntà nke akuku nke-etiti di n'akuku aka-nri nke ulo ahu: ha we si n'uzọ-nrigo nke nāga buruburu nārigo n'ulo ntà nke-etiti, si kwa na nke-etiti je rue nke-atọ. O we wue ulo ahu, wusia ya; o we were ibo na akuku osisi cedar kpue ulo ahu. O wue okpukpu-ulo n'aru ulo ahu nile, cubit ise ka idi-elu-ha di: ha we dabere n'ulo ahu n'osisi cedar. Okwu Jehova we biakute Solomon, si, Ulo a nke gi onwe-gi nēwu, ọ buru na i jegharia n'ukpurum nile, ọ buru kwa na i me ihe nile M'kpere n'ikpe, ọ buru kwa na i debe ihe nile M'nyere n'iwu ijeghari nime ha; M'gēme kwa ka okwum guzosie ike n'ebe i nọ, bú nke M'gwara Devid, bú nna-gi. M'gēbi kwa n'etiti umu Israel, M'gaghi-arapu kwa ndim, bú Israel.

I. NDI-EZE 6:1-13 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Solomọn bidoro iwu ụlọnsọ ukwu ONYENWE ANYị ahụ nʼọnwa Zif, bụ ọnwa nke abụọ nʼafọ nke anọ nke ịbụ eze ya. Ọ bụkwa nʼafọ nke mere ya narị afọ anọ na iri afọ asatọ site nʼoge ndị Izrel si nʼala Ijipt pụta. Ụlọnsọ nke eze Solomọn wuuru ONYENWE ANYị dị iri mita abụọ na asaa nʼogologo, mita itoolu nʼobosara, ebe ịla elu ya dịkwa mita iri na anọ. Mpụta ọnụ ụlọ nke dị nʼihu ụlọ ezumezu nke ụlọnsọ ahụ dị mita itoolu nʼogologo nke gbakwunyere ihe nʼobosara ụlọnsọ ahụ, dịrịkwa mita anọ na ọkara nʼobosara ya. O meere ụlọnsọ ahụ oghereikuku kpara nkpa nʼime ma saa mbara nʼezi, nʼebe elu elu mgbidi ụlọ ahụ. Nʼakụkụ mgbidi ụlọ ezumezu ahụ nakwa mgbidi nke ime ebe nsọ ahụ, o wuru okpukpu gburugburu ụlọ ahụ, nke nwere ọtụtụ ụlọ nta dị iche iche gbaa gburugburu. Obosara okpukpu ụlọ nke dịkarịsịrị ala bụ mita abụọ na ọkara, obosara okpukpu nke ụlọ etiti dị mita atọ, otu a kwa, obosara okpukpu ụlọ nke atọ dị mita atọ na ọkara. Mgbe e wuru mgbidi gbara ụlọnsọ ukwu ahụ gburugburu, e wukwara ihe dịka aka nʼakụkụ mgbidi ahụ niile. Ọ bụ nʼelu ihe ndị a dịka aka ka e dokwasịrị osisi e ji wuo ọnụụlọ nta ndị ahụ. Nʼụzọ dị otu a, ka e ji gbochie ịmanye ihe ọbụla nʼaja ụlọnsọ ukwu ahụ. Mgbe a na-ewu ụlọnsọ ukwu ahụ, ọ bụ naanị nkume awara nke ọma nʼebe a nọ gwupụta ha ka eji wuo ya. O nweghị onye nụrụ ụzụ itipịa nkume, maọbụ ụzụ ịwa osisi, maọbụ ụdị mkpọtụ ahụ ngwa ọrụ mkpirisi igwe na-eme, nʼebe a nọ wuo ụlọnsọ ukwu ahụ, mgbe a na-ewu ya. Ọnụ ụzọ e si abata nʼọnụ ụlọ ndị dị nʼokpukpu ụlọ elu nke mbụ dị nʼakụkụ aka nri nke ụlọnsọ ukwu ahụ. E nwekwara ụzọ nrigo e wuru e si abanye nʼọnụ ụlọ ndị dị nʼokpukpu ndị dị nʼetiti. A na-esitekwa na nke a rigoro ruo na nke atọ. Mgbe o wusiri ụlọnsọ ukwu a, Solomọn jiri ibe osisi na osisi dị obosara e si nʼosisi sida mepụta, wuo ihe mgbachị elu ụlọ ahụ. O wuru ọtụtụ ọnụụlọ nta nʼakụkụ mgbidi gbara ụlọnsọ ukwu ahụ gburugburu. Ọ bụkwa osisi sida ka e ji jikọta mgbidi ụlọ ahụ na ọnụụlọ nta ndị ahụ. Ịdị elu nke ọbụla nʼime ha bụ mita abụọ na ọkara. Okwu ONYENWE ANYị rutere Solomọn ntị, “Banyere ụlọnsọ ukwu a i na-ewu, ọ bụrụ na i mee ihe m gwara gị, gbasoo ihe niile m nyere gị nʼiwu, ma mezuo okwu m niile, aga m esite na gị mezuo nkwa ahụ m kwere nna gị Devid. Aga m ebikwa nʼetiti ndị Izrel, agaghị m ahapụkwa ndị m, Izrel.”