Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

I. NDI KỌRINT 10:1-20

I. NDI KỌRINT 10:1-20 Bible Nso (IGBOB)

N'ihi na achọghm, umu-nnam, ka unu ghara imara, na nna-ayi-hà nile nọri n'okpuru igwe-oji ahu, ha nile gabiga-kwa-ra oké osimiri ahu; eme-kwa-ra ha nile baptism ibà nime Moses nime igwe-oji ahu na nime oké osimiri ahu; ha nile ri-kwa-ra otù ihe-oriri ahu nke mọ; ha nile ṅu-kwa-ra otù ihe-ọṅuṅu ahu nke mọ: n'ihi na ha nāṅu miri nke si na nkume nke mọ nke soro ha: nkume ahu bu kwa Kraist. Ma ihe ndi kari n'etiti ha adighi Chineke ezi nma: n'ihi ya akwaturu ha n'ọhia. Ma ihe ndia ghọrọ ihe-atù nye ayi, ka ayi we ghara ibu ndi agu ihe ọjọ nāgu, dika agu ihe ọjọ gu-kwa-ra ndi ahu. Unu aghọ-kwa-la ndi nēkpere arusi, dika ufọdu n'etiti ha ghọrọ; dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ, si, Ndi Israel nọduru ala iri ihe na iṅu ihe, ha we bilie igwu egwú. Ka ayi ghara kwa ikwa iko, dika ufọdu n'etiti ha kwara, we da nwua n'otù ubọchi, ọgu nnù madu abua na nnù iri na asa na ọgu iri. Ka ayi ghara kwa inwa Onye-nwe-ayi, dika ufọdu n'etiti ha nwara, agwọ we la ha n'iyì. Unu atamu-kwa-la, dika ufọdu n'etiti ha tamuru, onye-nbibi ahu we la ha n'iyì. Ma ihe ndia nēmeri ndi ahu n'uzọ ihe-atù; ewe de ha n'akwukwọ nsọ ka ha we buru ihe idu ayi ọdú, ndi ọgwugwu oge ndia ruteworo. Ya mere, onye nēchè na o nēguzo, ya lezi anya ka ọ ghara ida. Ọ dighi ọnwunwa ọ bula nwaworo unu ma-ọbughi nke madu nānagide: ma Chineke kwesiri ntukwasi-obi, Onye nāgaghi-ekwe ka anwa unu kari nke unu puru inagide; kama n'oge ọnwunwa ahu Ọ gēme kwa uzọ nb͕apu, ka unu we nwe ike inagide ya. N'ihi nka, ndi m'huru n'anya, b͕anarinu ikpere-arusi. Anamekwu dika anamagwa ndi nwere uche; unu onwe-unu tule ihe m'nēkwu. Iko nke ngọzi ahu nke ayi nāgọzi, ọ̀ bughi nnwekọ ọbara Kraist? Achicha ahu nke ayi nānyawa, ọ̀ bughi nnwekọ aru Kraist? n'ihi na otù achicha di, ayi, ọ bu ezie na ayi di ọtutu, ma ayi bu otù aru: n'ihi na ayi nile nēketa òkè n'otù achicha ahu. Lenu Israel dika anu-aru si di: ndi nēri àjà, hà na ebe-ichu-aja adighi-enwekọ? Gini kwa ka m'nēkwu? nà ihe achuru n'aja nye arusi bu ihe ọ bula, ma-ọbu na arusi bu ihe ọ bula? Kama okwu m'nēkwu bu, na ihe ndi mba ọzọ nāchu n'àjà, ha nāchuru ndi-mọ ọjọ, ọ bughi kwa Chineke ka ha nāchuru: ma achọghi m ka unu ghọ ndi unu na ndi-mọ ọjọ nēnwekọ.

I. NDI KỌRINT 10:1-20 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Ụmụnna m, achọghị m ka unu chefuo ihe mere nna nna anyị ha mgbe ha jere ije nʼime ọzara. O ji igwe ojii duo ha. O mekwara ka ha si nʼetiti Osimiri Uhie gafee. Nʼime igwe ojii ahụ, na nʼime osimiri ahụ e tinyere ha niile na baptizim, dịka ndị na-eso ụzọ Mosis. Ha niile rikwara ihe oriri nke mmụọ ahụ. Ha ṅụkwara mmiri mmụọ ahụ, mmiri sitere nʼoke nkume mmụọ ahụ, nke na-eso ha. Oke nkume ahụ bụ Kraịst nʼonwe ya. Nʼihe ndị a niile, omume ha amasịghị Chineke. Nʼihi nke a, ọ lara ha nʼiyi nʼime ọzara. Ugbu a, ihe ndị a niile bụkwa ihe ịdọ aka na ntị nye anyị, ka anyị hapụ ịbụ ndị agụụ ime ihe ọjọọ na-agụ dịka ha. Unu abụla ndị na-ekpere arụsị dịka ụfọdụ ha mere. Dịka e dere ya, “Ndị a nọdụrụ ala iri ihe na ịṅụ ihe ọṅụṅụ, biliekwa ọtọ gwurie egwu ime onwe ha obi ụtọ.” Ka anyị ghara ịkwa iko dịka ụfọdụ nʼime ha mere, iri puku mmadụ abụọ na atọ nʼime ha nwụọ nʼotu ụbọchị. Ka anyị hapụ ịnwa Kraịst ọnwụnwa dịka ụfọdụ nʼime ha si nwaa Chineke. E mere ka agwọ tagbusie ha. Ka anyị hapụkwa itamu ntamu dịka ụfọdụ ha mere ma bụrụ ndị Mmụọ ozi ọnwụ tigburu. Ihe ndị a niile dakwasịrị ha ka ọ bụrụ ihe ilere anya nye anyị. E dekwara ha nʼakwụkwọ ka ha bụrụ anyị ihe ịdọ aka na ntị nʼihi na anyị bi nʼoge a mgbe ọgwụgwụ ihe niile dị nso. Ya mere, ọ bụrụ na ị na-eche na ị guzosiri ike, lezie anya ka ị ghara ịda. O nweghị ọnwụnwa ọbụla nwara unu nke abịakwutebeghị mmadụ. Chineke kwesiri ntụkwasị obi, ọ gaghị ekwe ka a nwaa unu karịa ike unu. Kama mgbe a na-anwa unu, ọ ga-enye unu ike imeri ọnwụnwa ma gosikwa unu ụzọ mgbapụ nʼime ya. Ya mere, ndị enyi m hụrụ nʼanya, gbaaranụ ikpere arụsị ọsọ. Ana m agwa ndị nwere uche okwu, unu onwe unu tulenụ ihe m na-ekwu. Iko ngọzị ahụ nke anyị na-agọzi, ọ bụghị iketa oke site nʼọbara Kraịst? Achịcha nke anyị na-anyawa, ọ bụghị iketa oke nʼahụ Kraịst? Nʼihi na otu achịcha dị, ọ bụ ezie na anyị dị ọtụtụ, anyị bụ otu ahụ, nʼihi na anyị niile na-eketa oke nʼotu ogbe achịcha ahụ. Chetanụ ka ndị Izrel siri mee: ọ bụ na ndị na-eri ihe eji chụọ aja abụghị ndị nnwekọ nʼebe ịchụ aja? Gịnị ka okwu ndị a m na-ekwu pụtara? Na arụsị, maọbụ ihe a chụrụ nʼaja nye arụsị bụ ihe ọbụla, maọbụ na ọ bụghị ihe? Mba! Ihe m na-ekwu bụ na ndị niile na-achụrụ arụsị aja jikọtara onwe ha nʼotu obi ịchụrụ ekwensu aja ahụ. Ọ bụghị Chineke. Achọkwaghị m ka unu bụrụ ndị e jikọtara ha na ekwensu.