Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ZEKARAIA 9:9-17

ZEKARAIA 9:9-17 IGBOB

Tegharia egwú ọṅù nke-uku, gi ada Zaion; tie nkpu, gi ada Jerusalem: le, eze-gi nābiakute gi: onye ezi-omume na onye nwere nzọputa ka ọ bu; onye ewedara n'ala, nke nānọkwasi kwa n'inyinya-ibu, ọbuná na nwa-inyinya, bú nwa-inyinya-ibu. M'gēbipu kwa ub͕ọ-ala n'Efraim, bipu kwa inyinya na Jerusalem, agēbipu kwa uta agha; Ọ gāgwa kwa mba nile okwu udo:Ọ gāchi kwa achi site n'otù oké osimiri rue oké osimiri ọzọ, site kwa n'Osimiri rue nsọtu nile nke uwa. Gi onwe-gi kwa, n'ihi ọbara ọb͕ub͕a-ndu-gi ka M'zipuworo ndi-nkpọrọ-gi n'olùlù nke miri nādighi nime ya. Laghachinu n'ebe ewusiri ike, unu ndi-nkpọrọ nke olile-anya ahu: ọbuná ta ka M'nēgosi na ọ bu okpukpu abua ka M'gēnyeghachi gi. N'ihi na azọworom Onwem Juda ukwu ikwe ya dika uta, uta ahu ka M'mejuworo n'Efraim dika àkú; M'gākpọte kwa umu-gi, Zaion, imegide umu-gi, Jevan, M'gēme kwa gi ka i di ka mma-agha dike. Ọ bu kwa Jehova ka agāhu n'elu ha, àkú-Ya gāpu kwa dika àmùmà: Onye-nwe-ayi Jehova gāfù kwa opì-ike, je ije n'oké ifufe di iche iche nke Ndida. Jehova nke usu nile nke ndi-agha gēb͕ochi ha; ha gēripia kwa, zọda nkume èbè nile; ha gāṅu kwa ihe-ọṅuṅu, me nkpọtu dika site na manya-vine: ha gējuputa kwa dika ọkwa-nwusa, dika nkuku nile nke ebe-ichu-àjà. Jehova, bú Chineke-ha, gāzọputa kwa ha n'ubọchi ahu dika ìgwè ewu na aturu ahu, bú ndi-Ya: N'ihi na nkume di oké ọnu-ahia nke okpu-eze ka ha gābu, ndi eweliworo elu dika ọkọlọtọ n'elu ala-Ya. N'ihi na le ka idi-nma-Ya si di uku! le kwa ka ima-nma-Ya si di uku! ọka gemeka umu-okorọbia tozue okè nke-ọma, manya-vine ọhu kwa umu-ab͕ọghọ nke nāmaghi nwoke.