Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

TAITỌS 3

3
1Nēchetara ha ka ha nēdo onwe-ha n'okpuru ndi-isi, n'okpuru ndi nwere ike, ka ha nēkwenye ekweye, ka ha buru ndi edoziworo ilu ezi ọlu nile ọ bula, 2ka ha ghara ikwulu onye ọ bula, ghara ibu ndi nālu ọ̀gù, ka ha nwe obi-ọma, nēgosi idi-nwayọ nile n'ebe madu nile nọ. 3N'ihi na ayi onwe-ayi buru kwa ndi nēnweghi uche n'oge gara aga, ndi nēkweyeghi, ndi anēduhie, ndi bu orù agu ihe ọjọ na ihe-utọ di iche iche, nēbi n'obi ọjọ na ekworo, ndi-ùrú, nākpọrita ibe-ayi asì. 4Ma mb͕e egosiri obi-ọma nke Onye-nzọputa-ayi Chineke, ya na ihu-n'anya-Ya n'ebe madu nọ, 5O siteghi n'ọlu di iche iche aluru n'ezi omume, nke ayi onwe-ayi luru, zọputa ayi, kama dika ebere-Ya si di, site n'ọsisa nke imu-ọzọ na nke ime ọhu nke Mọ Nsọ nēme, 6Onye Ọ wusara ayi nime àkù-Ya nile, site n'aka Jisus Kraist Onye-nzọputa-ayi; 7ka, ebe ewere amara-Ya gua ayi na ndi ezi omume, ka ayi we ghọ ndi-nketa dika olile-anya nke ndu ebighi-ebi si di. 8Okwu a kwesiri ntukwasi-obi, anamezube kwa ka i kwusie okwu bayere ihe ndia ike, ka ndi kweworo okwu Chineke we tukwasi uche n'ibu ndi-isi n'ọlu ọma. Ihe ndia di nma buru kwa ihe bara madu urù: 9ma nēze ajuju nzuzu nile, na osuso-ọmumu nile, na esem-okwu nile, na ilu-ọ̀gù nile bayere iwu; n'ihi na ha bu ihe nābaghi urù na ihe-efu. 10Ju madu nke nārọ òtù, mb͕e i dusiri ya ọdu nke-mbu na nke-abua; 11ebe i matara na atughariwo obi madu di otú a, ọ nēmehie kwa, ebe ọ bu onye mara onwe-ya ikpé.
12Mb͕e ọ bula m'gēzitere gi Atemas, ma-ọbu Tikikọs, were inu-ọku-n'obi biakutem rue Naikọpọlis: n'ihi na n'ebe ahu ka m'zubeworo inọgide na mb͕e oyi. 13Were inu-ọku-n'obi dupu Zinas onye-iwu na Apọlos n'ije-ha, ka ihe ọ bula ghara ifọdu nke ha nēnweghi. 14Ka ndi-ayi muta kwa ibu ndi-isi n'ọlu ọma ib͕o nkpà nākpa umu-nna-ayi, ka ha ghara ibu ndi nāmighi nkpuru.
15Ndi nile mu na ha nọ nēkele gi. Kele ndi huru ayi n'anya n'okwukwe.
Ka amara dinyere unu nile.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

TAITỌS 3: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye