ABÙ ỌMA 89
89
Maschil Itan, bú onye-Ezrahait.
1Ebere nile nke jehova ka m'gābù abù-ha rue mb͕e ebighi-ebi:
Ọb͕ọ nile ka m'gēwere ọnum me ka ha mara ikwesi-ntukwasi-obi-Gi.
2N'ihi na asiwom, Rue mb͕e ebighi-ebi ka agēwuli ebere elu dika ulo;
Elu-igwe, I gēme ka ikwesi-ntukwasi-obi-Gi guzosie ike nime ha.
3Mu na onye M'rọputara ab͕awo ndu,
Aṅuworom Devid, bú orùm, iyi;
4Rue mb͕e ebighi-ebi ka M'gēme ka nkpuru-gi guzosie ike,
M'gēwu kwa oche-eze-Gi rue ọb͕ọ nile. Selah
5Elu-igwe gēkele kwa oké ọlu-Gi, Jehova;
Kele kwa ikwesi-ntukwasi-obi-Gi nime nkpọkọta nke ndi nsọ.
6N'ihi na ònye nime mbara-ígwé ka agēji turu Jehova?
Ònye yiri Jehova n'etiti umu Chineke?
7Ọ bu Chineke Nke anāmara jijiji ri nne n'ìzù nzuzo nke ndi nsọ,
Ọ bu kwa Onye anātu egwu Ya kari ndi nile di Ya buruburu.
8Jehova, Chineke nke usu nile nke ndi-agha,
Ònye di ike dika Gi, Ja?
Ikwesi-ntukwasi-obi-Gi di kwa Gi buruburu.
9Gi onwe-gi nāchi nbili-elu nke oké osimiri:
Mb͕e nmali-miri-ya nile nēbuli onwe-ha elu, Gi onwe-gi nēme ka ha dajua.
10Gi onwe-gi azọpiawo Rehab, dika onye eb͕uru eb͕u;
I werewo ogwe-aka nke ike-Gi chusa ndi-iro-Gi.
11Gi nwe elu-igwe, Gi nwe kwa uwa:
Elu-uwa dum madu bi na ùjú-ya, Gi onwe-gi atọwo ntọ-ala-ha.
12Ugwu na Ndida, Gi onwe-gi ekèwo ha:
Teboa na Heamon nēti nkpu ọṅù n'aha-gi.
13Gi nwere ogwe-aka nke idi-ike di nime ya:
Aka-Gi di ike, aka-nri-Gi di elu.
14Ezi omume na ikpe ziri ezi bu ọnọdu guzosiri ike nke oche-eze-Gi:
Ebere na ezi-okwu nāga n'iru Gi.
15Ndi ihe nāgara nke-ọma ka ndi ahu bu nke mara olu iti-nkpu ahu:
Jehova, n'ìhè nke iru-Gi ka ha nēje ije.
16N'aha-Gi ka ha nēteghari egwú ọṅù ogologo ubọchi nile:
Ọ bu kwa n'ezi omume-Gi ka ha nādi elu.
17N'ihi na ima-nma nke ike-ha ka I bu:
Ọ bu kwa n'utọ ihe-ayi nātọ Gi ka mpi-ayi nādi elu.
18N'ihi na Jehova nwe ọta-ayi;
Ọ bu kwa Onye Nsọ nke Israel nwe eze-ayi.
19Mb͕e ahu I gwara ndi-ebere-Gi okwu n'ọhù,
Si, Atukwasiwom iye-aka n'aru dike;
Emewom ka otù onye arọputaworo n'etiti ndim di elu.
20Achọtawom Devid, bú orùm;
Ewerewom manu nsọm te ya:
21Onye akam gēguzosi ike n'ebe ọ nọ;
Ọzọ, ogwe-akam gāb͕a ya ume.
22Onye-iro agaghi-abiakwasi ya na mberede;
Ọzọ, nwa nke ajọ omume agaghi-eweda ya n'ala.
23M'gētipia kwa ndi nākpab͕u ya n'iru ya,
Ti kwa ndi nākpọ ya asì ihe.
24Ma ikwesi-ntukwasi-obim na eberem gādi n'aru ya:
Ọ bu kwa n'aham ka mpi-ya gādi elu.
25M'gēdo kwa aka-ya n'oké osimiri,
Do kwa aka-nri-ya n'osimiri nile.
26Onye ahu gākpọm, si, Nnam ka I bu,
Chinekem, na oké nkume nke nzọputam.
27Ọzọ, Mu onwem gēme ya ọkparam,
Onye kachasi ihe nile elu n'ebe ndi-eze nke uwa nọ.
28Rue mb͕e ebighi-ebi ka M'gēdebere ya eberem,
Ọb͕ub͕a-ndum gēkwesi-kwa-ra ya ntukwasi-obi.
29M'gēme kwa ka nkpuru-ya dirue mb͕e ebighi-ebi,
Me kwa ka oche-eze-ya di ka ubọchi nile nke elu-igwe.
30Ọ buru na umu-ya arapu iwum,
Ghara kwa ijeghari n'ikpém nile;
31Ọ buru na ha eme ka ukpurum nile ghara idi nsọ,
Ọ buru kwa na ha edebeghi ihe nile M'nyere n'iwu;
32M'gēwere kwa nkpa-n'aka leta njehie-ha,
Were kwa ihe-otiti leta ajọ omume-ha.
33Ma M'gaghi-esi n'ebe ọ nọ mebie eberem,
M'gaghi-ekwu kwa okwu-ugha megide ikwesi-ntukwasi-obim.
34M'gagh-eme ka ọb͕ub͕a-ndum ghara idi nsọ,
Ọzọ, M'gagh-agbanwe ihe siworo n'eb͕ub͕ere-ọnum abua puta.
35Otù ub͕ò ka M'jiworo idi-nsọm ṅua iyi;
M'gaghi-agwa Devid okwu-ugha ma-ọli;
36Nkpuru-ya gādiru mb͕e ebighi-ebi,
Oche-eze-ya gādi kwa ka anyanwu n'irum.
37Dika ọnwa ka o gēguzosi ike rue mb͕e ebighi-ebi;
Ọzọ, Onye-àmà Nke nọ na mbara-ígwé kwesiri ntukwasi-obi. Selah
38Ma Gi onwe-gi achipuwo, ju kwa aju.
I wesabigawo onye-Gi etere manu iwe ókè.
39I sọwo ọb͕ub͕a-ndu nke orù-Gi oyi:
I mewo ka okpu-eze-ya ghara idi nsọ ọbuná rue ala.
40I tiwawo ogige-ya nile;
I mewo ka ebe-ya nile ewusiri ike buru ihe dapiara adapia.
41Ndi nile nke nāgabiga n'uzọ apunarawo ya ihe:
Ọ ghọworo ndi-ab͕ata-obi-ya ihe-ita-uta.
42I mewo ka aka-nri nke ndi nākpab͕u ya di elu;
I mewo ka ndi-iro-ya nile ṅuria.
43Ọzọ, I nēme ka ọnu mma-agha-ya laghachi azu,
I meghi kwa ka o guzosie ike n'agha.
44I mewo ka onwunwu-ọcha-ya kwusi,
I tudawo kwa oche-eze-ya rue ala.
45I bilatawo ubọchi nile ọ bu okorọbia:
I werewo ihere kpuchie ya n'aru. Selah
46Jehova, rùe ole mb͕e ka I gēzobe onwe-gi ebighi-ebi?
Rùe ole mb͕e ka ọnuma-Gi ganēre dika ọku?
47Cheta otú mb͕e ndu mu onwem di nkpunkpu:
Ọ̀ bu ihe-efu gini ka I kèworo umu madu nile nye?
48Òle nwoke ọ bu nke gādi ndu, ghara ihu ọnwu anya,
Nke gēme ka nkpuru-obi-ya wepuga onwe-ya n'aka ala-mọ? Selah
49Òle ebe ebere, mbu Gi nile di. Onye-nwe-ayi,
Nke I ṅuru Devid iyi bayere ha n'ikwesi-ntukwasi-obi-Gi?
50Onye-nwe-ayi, cheta ita-uta ndi-orù-Gi;
Eburuwom n'obim ita-uta nke ndi nile di iche iche bara uba;
51Nke ndi-iro-Gi jiworo ta uta, Jehova,
Nke ha jiworo ta nzọ-ukwu nile nke onye-Gi etere manu uta.
52Onye agọziri agọzi ka Jehova bu rue mb͕e ebighi-ebi.
Amen, na Amen.
AKWUKWỌ NKE-ANỌ
Nke Ahọpụtara Ugbu A:
ABÙ ỌMA 89: IGBOB
Mee ka ọ bụrụ isi
Kesaa
Mapịa
Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye
Igbo Bible © Bible Society of Nigeria © 1906, 2006.