Chineke, nye eze ikpé-Gi nile, Nye kwa nwa eze ezi omume-Gi. O gēji ezi omume kpe ndi-Gi ikpe, O gēji kwa ikpe ziri ezi kpe ndi-Gi ewedara n'ala. Ugwu nile gēbutere ndi-Gi udo, Ugwu ntà kwa, n'ezi omume. Ọ gēkpe ndi ewedara n'ala n'etiti ndi-Gi ikpe, Ọ gēnye umu nke ob͕eye nzọputa, Zọpia kwa onye-nmeb͕u. Ha ganātu egwu Gi ogologo mb͕e anyanwu gādigide, Na n'iru ọnwa, rue ọb͕ọ nile. Ọ gārida dika miri-ozuzo si ezokwasi n'ọzara asuru asu: Dika oké miri-ozuzo nke nēdè ala. Onye ezi omume gāma akwukwọ n'ubọchi nile ya dika osisi ndu; Ọtutu udo gādi kwa rue mb͕e ọnwa agaghi-adi. Ya nwe kwa ike n'aru madu site n'otù oké osimiri rue oké osimiri ọzọ, Site kwa n'Osimiri rue nsọtu nile nke uwa. Ndi bi n'ala kpọrọ nku gēruru ala n'iru ya; Ọzọ, ndi-iro-ya gāracha ájá. Ndi-eze Tashish na nke ala nile di oké osimiri buruburu gēnye onyinye-inata-iru-ọma: Ndi-eze Sheba na Seba gēweta ùtú nso. E, eze nile gākpọ isi ala nye ya: Mba nile gēfè ya òfùfè. N'ihi na ọ gānaputa ob͕eye mb͕e o nētiku ya; Ọ gānaputa kwa onye ewedara n'ala mb͕e ọ dighi onye nēyere ya aka. Ọ gēmere onye nēnweghi ike na ob͕eye ebere, Ọ bu kwa nkpuru-obi ndi-ob͕eye ka ọ gāzọputa. Ọ gēsi n'aka nzọb͕u na n'aka ime-ihe-ike b͕aputa nkpuru-obi-ha; Ọbara-ha gādi kwa oké ọnu-ahia n'anya-ya. Ya di kwa ndu! agēnye kwa ya ufọdu n'ọla-edo Sheba: Agēkpe kwa ekpere bayere ya mb͕e nile; Ogologo ubọchi nile ka agāgọzi ya. Ka ọtutu ọka di n'ala n'elu ugwu nile; Nkpuru-ya ganēme nkpatu dika Lebanon: Madu gēsi kwa n'obodo wa okoko-osisi dika ihe akuru n'ala. Ka aha-Ya dirue mb͕e ebighi-ebi; N'iru anyanwu ka aha-Ya gāmu ọmùmù: Madu gāgọzi kwa onwe-ha nime ya: Mba nile gākpọ ya onye ihe nāgara nke-ọma. Onye agọziri agọzi ka Jehova, bú Chineke, bu, bú Chineke nke Israel, Onye nání Ya nālu oké ọlu di iche iche: Ihe agọziri agọzi ka aha nsọpuru Ya bu kwa rue mb͕e ebighi-ebi; Ka uwa nile juputa kwa na nsọpuru-Ya. Amen, na Amen. Ekpere nke Devid nwa Jesi agwuwo.
Gụọ ABÙ ỌMA 72
Geere nke a ntị ABÙ ỌMA 72
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: ABÙ ỌMA 72:1-20
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ulo
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ
Vidiyo