Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ILU 19

19
1Ọ di nma, bú ob͕eye nke nēje ije n'izu-okè-ya,
Kari onye eb͕ub͕ere-ọnu-ya b͕agọrọ ab͕agọ n'okwu, onye bu kwa onye-nzuzu.
2Ọzọ, mb͕e nkpuru-obi nēnweghi ihe-ọmuma ọ dighi nma;
Onye ukwu-ya nēme ngwa nēhie uzọ.
3Uche b͕agọrọ ab͕agọ nke madu nēkpù uzọ-ya iru;
Ọ bu kwa imegide Jehova ka obi-ya di ọku.
4Àkù nātukwasiri madu ọtutu eyì:
Ma onye nēnweghi ihe, anēkewapu ya n'ebe eyì-ya nọ.
5Agaghi-agu onye-àmà okwu-ugha n'onye nēmeghi ihe ọjọ;
Ọzọ, onye nēkupu okwu-ugha dika ume agaghi-ewepuga onwe-ya.
6Ọtutu madu nāchọ ime ka iru onye amara aha-ya dajua:
Onye ọ bula bu-kwa-ra onye nēnye onyinye eyì.
7Umu-nne nile nke ob͕eye nākpọ ya asì:
Ǹdi-eyì-ya gēsi aṅa ghara inọ ya n'ebe di anya kari!
Ọ nāb͕aso okwu-ọnu di iche iche nke nābughi ihe.
8Onye nēnweta obi amam-ihe nāhu nkpuru-obi-ya n'anya:
Onye nēdebe nghọta gāchọta ezi ihe.
9Agaghi-agu onye-àmà okwu-ugha n'onye nēmeghi ihe ọjọ;
Ọzọ, onye nēkupu okwu-ugha dika ume gāla n'iyì.
10Idi-pekepeke amaghi onye-nzuzu nma;
Ò gēsi kwa aṅa ma orù nma ichi ndi-isi?
11Ezi uche madu nēme ka ọ ghara iwe iwe ọsọsọ;
Ọ bu kwa ima-nma-ya igabiga njehie.
12Ọb͕ub͕ọ-uja dika nke ọdum ka iwe di ọku nke eze bu;
Ma dika igirigi n'elu ihe-ọkukú ka utọ ihe madu nātọ ya di.
13Ila-n'iyi nile n'ebe nna-ya nọ ka nwa nzuzu bu:
Ọzọ, miri-ọtutu nātu mb͕e nile ka ise-okwu nwunye bu.
14Ulo na àkù bu ihe-nketa ndi bu nna nārapu:
Ma Jehova ka nwunye nke nwere uche sitere n'aka.
15Ume-ngwu nēme ka oké ura dakwasi madu;
Ọ bu kwa nkpuru-obi nke di ume-ngwu ka agu nāgu.
16Onye nēdebe ihe enyere n'iwu nēdebe nkpuru-obi-ya:
Onye nēleda uzọ-ya nile anya gānwu.
17Onye nēbinye Jehova ihe ka onye nēmere onye nēnweghi ike amara bu,
Ọ bu kwa nmeso ọma ya ka Ọ gākwughachi ya.
18Dọ nwa-gi aka na nti, n'ihi na olile-anya di;
Atukwasi-kwa-la obi-gi n'ime ka ọ nwua.
19Onye oké ọnuma ganāra nra:
N'ihi na ọ buru na i naputa ya, i gēme kwa ya ọzọ.
20Nuru ndum-ọdu, nara kwa idọ-aka-na-nti,
Ka i we mara ihe n'ikpe-azu-gi.
21Ọtutu èchìchè di n'obi madu;
Ma ndum-ọdu Jehova, nke ahu gēguzosi ike.
22Ihe nēme ka anāchọsi madu ike bu ebere-ya:
Ọzọ, ob͕eye di nma kari onye-okwu-ugha.
23Egwu Jehova nēdubà na ndu:
Onye nwe-kwa-ra ya, ọ gānọ n'afọ-ojuju;
Ihe ọjọ agaghi-eleta ya.
24Onye-ume-ngwu esumiwo aka-ya n'ọkwa,
Ọ gaghi-eweghachi ya ọbuná n'ọnu-ya.
25Tie onye nākwa emò ihe, onye nēnweghi uche gāghọ onye nwere ezi uche:
Ọzọ, bara onye-nghọta nba, ọ gāghọta ihe-ọmuma.
26Onye nāpunara nna-ya ihe, nke nēme kwa ka nne-ya b͕alaga,
Bu nwa nēweta ihere nēme kwa ka enwe iru-ihere.
27Nwam, rapu inu idọ-aka-na-nti
Nke nēme ka i si n'okwu-ọnu nile nke ihe-ọmuma waghari.
28Onye-àmà nke jọb͕uru onwe-ya nākwa ikpé emò:
Ọzọ, ọnu ndi nēmebi iwu nēloda ajọ ihe.
29Edoziworo ndi nākwa emò ikpé di iche iche,
Ọ bu kwa iti-ihe di iche iche ka edoziworo nye azu ndi-nzuzu.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

ILU 19: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye