ỌNU-ỌGUGU 2
2
1Jehova we gwa Moses na Eron okwu, si, 2Umu Israel gāma ulo-ikwū-ha, nwoke ọ bula n'akuku ọkọlọtọ-ya, ha na ihe-iriba-ama nile nke diri ulo nke ndi bu nna-ha: na ncherita-iru ulo-ikwū nzute ka ha gāma ulo-ikwū-ha buruburu. 3Ndi nāma ulo-ikwū-ha n'akuku. Iru-anyanwu chere iru n'ọwuwa-anyanwu bu ndi nke ọkọlọtọ ọmuma-ulo-i kwū Juda, dika usu nile nke ndi-agha-ha si di: onye-isi umu Juda nwere bu Nahshon nwa Aminadab. 4Usu-ndi-agha-ya, na ndi-ha agukọtara agukọta, di orú nnù uzọ iteghete na nnù isi na ọgu iri. 5Ndi nāma ulo-ikwū-ha n'akuku-ya bu ebo Isaka: onye-isi umu Isaka nwere bu Netanel nwa Zua: 6usu-ndi-agha-ya, na ndi-ya agukọtara agukọta, di orú nnù uzọ isi na nnù iri-na-isi: 7ebo Zebulun kwa: onye-isi umu Zebulun nwere bu Eliab nwa Hilon: 8usu-ndi-agha-ya, na ndi-ya agukọtara agukọta, di orú nnù uzọ asa na nnù atọ na ọgu iri. 9Ndi nile agukọtara agukọta nke ọmuma-ulo-ikwū Juda di orú nnù orú uzọ na uzọ atọ, na nnù isi, dika usu nile nke ndi-agha-ha si di. Ha gēbu uzọ buli ije.
10Ọkọlọtọ nke ọmuma-ulo-ikwū Reuben di n'akuku Ndida, dika usu nile nke ndi-agha-ha si di; onye-isi umu Reuben nwere bu Elizua nwa Shedeua. 11Usu-ndi-agha-ya, na ndi-ya agukọtara agukọta, di orú nnù uzọ ise na nnù iri-na-isi na ọgu ise. 12Ndi nāma ulo-ikwū-ha n'akuku-ya bu ebo Simeon: onye-isi umu Simeon nwere bu Shelumiel nwa Zurishadai: 13usu-ndi-agha-ya, na ndi-ha agukọtara agukọta, di orú nnù uzọ asa na nnù asatọ na ọgu ise: 14ebo Gad kwa: onye-isi umu Gad nwere bu Eliasaf nwa Reuel: 15usu-ndi-agha-ya, na ndi-ha agukọtara agukọta, di orú nnù uzọ ise na nnù iri-na-anọ na ọgu abua na iri. 16Ndi nile agukọtara agukọta nke ọmuma-ulo-ikwū Reuben di orú nnù uzọ iri na asatọ, na nnù iri-na-asatọ, na ọgu iri-na-abua, na iri, dika usu nile nke ndi-agha-ha si di. Ha gābu nke-abua n'ibuli ije.
17Ulo-ikwū nzute gēbuli kwa ije, ya na ọmuma-ulo-ikwū ndi Livai, n'etiti ọmuma-ulo-ikwū nile: dika ha si ama ulo-ikwū-ha, otú a ka ha gēbuli ije, nwoke ọ bula n'akuku-ya, dika ọkọlọtọ nile ha si di.
18Ọkọlọtọ nke ọmuma-ulo-ikwū Efraim, dika usu nile nke ndi-agha-ha si di, di n'akuku Ọdida-anyanwu: onye-isi umu Efraim nwere bu Elishama nwa Amihud. 19Usu-ndi-agha-ya, na ndi-ha agukọtara agukọta, di orú nnù uzọ ise na nnù na ọgu ise. 20N'akuku-ya ka ebo Manase di: onye-isi umu Manase nwere bu Gameliel nwa Pedahzua: 21Usu-ndi-agha-ya, na ndi-ha agukọtara agukọta, di orú nnù uzọ anọ, na ọgu iri: 22ebo Benjamin kwa: onye-isi umu Benjamin nwere bu Abidan nwa Gideoni: 23Usu-ndi-agha-ya, na ndi-ha agukọtara agukọta, di orú nnù uzọ anọ na nnù asatọ na ọgu iri. 24Ndi nile agukọtara agukọta nke ọmuma-ulo-ikwū Efraim di orú nnù uzọ iri-na-atọ, na nnù iri, na ọgu ise, dika usu nile nke ndi-agha-ha si di. Ha gābu nke-atọ n'ibuli ije.
25Ọkọlọtọ nke ọmuma-ulo-ikwū Dan di n'akuku Ugwu, dika usu nile nke ndi-agha-ha si di; onye-isi umu Dan nwere bu Ahieza nwa Amishadai. 26Usu-ndi-agha-ya, na ndi-ha agukọtara agukọta, di orú nnù uzọ asa na nnù iri-na-isi na ọgu iri-na ise. 27Ndi nāma ulo-ikwū-ha n'akuku-ya bu ebo Asha: onye-isi umu Asha nwere bu Pagiel nwa Ọkran: 28usu-ndi-agha-ya, na ndi-ha agukọtara agukọta, di orú nnù uzọ ise na nnù atọ na ọgu iri-na-ise: 29ebo Naftali kwa: onye-isi umu Naftali nwere bu Ahira nwa Inan: 30usu-ndi-agha-ya, na ndi-ha agukọtara agukọta, di orú nnù uzọ isi na nnù iri-na-atọ na ọgu iri. 31Ndi nile agukọtara agukọta nke ọmuma-ulo-ikwū Dan di orú nnù uzọ iri-na-iteghete, na nnù iri-na-anọ. Ha gābu ndi ikpe azu n'ibuli ije, dika ọkọlọtọ nile ha si di.
32Ndia bu ndi agukọtara agukọta nke umu Israel, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di: ndi nile agukọtara agukọta nke ọmuma-ulo-ikwū nile, dika usu nile nke ndi-agha-ha si di, di orú nnù ọgu uzọ atọ na uzọ iri-na-ise, na nnù asatọ, na ọgu iri-na-asa, na iri. 33Ma agukọtaghi ndi Livai n'etiti umu Israel; dika Jehova nyere Moses iwu 34Umu Israel we me otú a; dika ihe nile Jehova nyere Moses n'iwu si di, otú a ka ha mara ulo-ikwū-ha dika ọkọlọtọ nile ha si di, ọ bu kwa otú a ka ha buliri ije, nwoke ọ bula dika ab͕uru nile ya si di, n'ulo nna-ya-hà
Nke Ahọpụtara Ugbu A:
ỌNU-ỌGUGU 2: IGBOB
Mee ka ọ bụrụ isi
Kesaa
Mapịa
Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye
Igbo Bible © Bible Society of Nigeria © 1906, 2006.