Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

MAK 14:27-72

MAK 14:27-72 IGBOB

Jisus we si ha, Agēme ka unu nile ma n'ọnyà: n'ihi na edeworo ya n'akwukwọ nsọ, si, M'gētib͕u Onye-ọzùzù-aturu, agāb͕asa kwa aturu-Ya. Ma mb͕e emere ka M'si n'ọnwu bilie, M'gēburu unu uzọ ga Galili. Ma Pita siri Ya, Ọ buru na agēme ọbuná madu nile ka ha ma n'ọnyà, ma agaghi-eme mu onwem. Jisus we si ya, N'ezie asim gi, na ta, bú n'abali a, mb͕e oke-ọkuku akākwaghi ákwá ub͕ò abua, i gāgọnaririn ub͕ò atọ. Ma ọ nēkwusi ike nke-uku, si, Ọ buru na ọ di nkpà ka m'so Gi nwua, m'gaghi-agọnari Gi ma-ọli. Ọ bu kwa otú a ka ha nile kwuru. Ha we biarue ogige nke aha-ya bu Getsemane: O we si ndi nēso uzọ-Ya, Nọdunu n'ebe a, rue mb͕e M'nēkpe ekpere. O we kuru Pita na Jemes na Jọn tiyere Onwe-ya, ibobo we malite inwu Ya n'aru nke-uku, obi malite-kwa-ra ilọ Ya miri. O we si ha, Ọ nēwuta nkpuru-obim nke-uku, rue ọnwu: nọgidenu n'ebe a, nēche-kwa-nu nche. O we ga n'iru nke-ntà, da n'ala, we kpe ekpere ka oge hour ahu we gabiga Ya, ma ọ buru na ọ gēkwe me. O we si, Aba, Nna, I puru ime ihe nile; naram iko a: ma ọ bughi ihe Mu onwem nāchọ, kama ihe Gi onwe-gi nāchọ. O we bia, hu ha ka ha nāraru ura, O we si Pita, Saimon, ì nāraru ura? ì nweghi ike iche nche otù oge hour? Nēchenu nche, nēkpe-kwa-nu ekpere, ka unu we ghara ibà n'ọnwunwa: mọ nke madu di ọku n'ezie, ma anu-aru adighi ike. O we rapu ha je kwa ọzọ, kpe ekpere, nēkwu otù okwu ahu. O we bia kwa ọzọ, hu ha ka ha nāraru ura, n'ihi na anya-ha di oké arọ́; ha amataghi kwa ihe ha gāza Ya. O we bia ọbibia nke-atọ, si ha, Nārarunu ura site n'ub͕u a, nēzu-kwa-nu ike: o zuwo: oge hour nkem eruwo; le, anārara Nwa nke madu nye n'aka ndi-nmehie. Bilienu, ka ayi je: le, onye nāraram nye nọ nso. Ngwa ngwa, mb͕e Ọ kpu okwu n'ọnu, Judas, otù onye n'etiti ndi-ozi iri na abua ahu, biara, ya na ìgwè madu ndi chiri mma-agha na osisi, site n'ebe ndi-isi-nchu-àjà na ndi-ode-akwukwọ na ndi-okenye nọ. Ma onye nārara Ya nye nyere ha-ri ihe-iriba-ama, si, Onye ọ bula m'gēsutu ọnu, Onye ahu bu Ya; jidenu Ya, lezienu anya duru Ya je. Mb͕e ọ biara, ngwa ngwa ọ biakutere Ya, si, Rabai; o we sutu Ya ọnu nke-uku. Ha we tukwasi Ya aka, jide Ya. Ma otù onye n'etiti ndi guzoro nso miputara mma-agha-ya, b͕u orù onye-isi-nchu-àjà mma, bipu nti-ya. Jisus we za, si ha, Ùnu putara chiri mma-agha na osisi ijidem, dika imegide onye nāpunara madu ihe? Kwa-ubọchi Mu na unu nọ n'ulo uku Chineke ebe M'nēzí ihe, ma unu ejideghm: ma emere nka ka ihe nile edeworo n'akwukwọ nsọ we mezu. Ha nile we rapu Ya, b͕alaga. Ma otù okorọbia sonyere Ya, onye b͕okwasiri ezi ákwà ọcha n'aru ọtọ ya: ha we jide ya: ma ọ rapuru ezi ákwà ọcha ahu, b͕ara ọtọ, b͕alaga. Ha we si n'ebe ahu duru Jisus jekuru onye-isi-nchu-àjà: ha nile, bú ndi-isi-nchu-àjà na ndi-okenye na ndi-ode-akwukwọ, we b͕akọ n'ebe ọ nọ. Pita soro kwa Ya-ri n'ebe di anya, rue nime ulo, nime obí onye-isi-nchu-àjà; ọ nānọdu kwa n'etiti ndi nēje ozi, ọ nānya ọku n'ihè ọku. Ma ndi-isi-nchu-àjà na nnọkọ-ikpé dum nāchọ àmà imegide Jisus ime ka Ọ nwua; ma ha achọtaghi. N'ihi na ọtutu madu nāb͕a àmà ugha imegide Ya, àmà-ha abughi kwa otù. Ufọdu we bilie, b͕a àmà ugha megide Ya, si, Ayi onwe-ayi nuru ka Ọ nāsi, Mu onwem gākwatu ulo nsọ a nke ejiri aka me, n'ubọchi atọ M'gēwu kwa ulo ọzọ nke anējighi aka me. Ọbuná otú a àmà-ha abughi kwa otù. Onye-isi-nchu-àjà we bilie n'etiti, jua Jisus, si, Ì zaghi ihe ọ bula? gini bu àmà madu ndia nāb͕agide Gi? Ma O kpuchiri ọnu, ọ dighi kwa ihe ọ bula Ọ zara. Onye-isi-nchu-àjà juba-kwa-ra Ya ọzọ, si Ya, Gì onwe-gi bu Kraist ahu, Ọkpara nke Onye ahu agọziri agọzi? Jisus we si, Mu onwem bu Ya: unu gāhu kwa Nwa nke madu ka Ọ nānọdu n'aka-nri nke ike, nābia kwa, Ya na igwe-oji nile nke elu-igwe. Onye-isi-nchu-àjà we dọwa uwe-ya nile, si, Ọ̀ bu nkpà ndi-àmà gini nākpa ayi ọzọ? Unu nuru nkwulu ahu: gini bu uche-unu? Ha nile we ma Ya ikpé, si na O kwesiri inwu ọnwu. Ufọdu we malite ibusa Ya ọnu-miri, na ikechi iru-Ya, na iti Ya aka, na isi Ya, Bu amuma: ndi nēje ozi we nara Ya n'ipia Ya ihe. Mb͕e Pita nọ n'okpuru n'obí, otù nime umu-ab͕oghọ ndi nējere onye-isi-nchu-àjà ozi we bia: mb͕e ọ huru Pita ka ọ nānya ọku, o we le ya anya, si, Gi onwe-gi na Onye Nazaret ahu, bú Jisus, nọ-kwa-ra. Ma ọ gọrọ, si, Amataghm, aghọtaghm kwa ihe gi onwe-gi nēkwu: o we pua je n'uzọ-nbata. Nwa-ab͕ọghọ ahu we hu ya, malite kwa ọzọ isi ndi guzoro nso, Nwoke a bu otù onye nime ha. Ma ọ gọ-kwa-ra ọzọ. Mb͕e nwa oge gasiri ndi guzoro nso we si kwa Pita ọzọ, N'ezie i bu otù onye nime ha; n'ihi na i bu kwa onye Galili. Ma ọ malitere idu ikwù, na iṅu iyí, si, Amataghm Nwoke a Onye unu nēkwu. Ngwa ngwa oke-ọkuku we kwa ákwá nke ub͕ò abua. Pita we cheta okwu ahu, otú Jisus siri ya, Mb͕e oke-ọkuku akākwaghi ub͕ò abua, i gāgọnarim ub͕ò atọ. Mb͕e ọ tulere okwu a n'obì o we kwa ákwá.