LEVITIKỌS 10
10
1Ma umu-ndikom Eron, bú Nedab na Abaihu, were ihe-igu-ọku, onye ọ bula ọ were nke ya, ha we tiye ọku nime ha, tukwasi ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'elu ya, we weta nso n'iru Jehova ọku ala ọzọ, nke Ọ nēnyeghi ha n'iwu. 2Ọku we si n'iru Jehova puta, ripia ha, ha we nwua n'iru Jehova. 3Moses we si Eron, Nka bu ihe Jehova kwuru, si, N'aru ndi nābiarum nso ka agēdom nsọ, ọ bu kwa n'iru ndim nile ka agāsọpurum. Eron we b͕a nkiti. 4Moses we kpọ Mishael na Elzafan, bú umu-ndikom Uziel nwa-nne nna Eron, si ha, Biaruenu nso, si n'iru ebe nsọ a bupu umu-nne-unu je n'azu ọmuma-ulo-ikwū. 5Ha we biaru nso, buru ha n'uwe-ime-ha je n'azu ọmuma-ulo-ikwū; dika Moses kwuru. 6Moses we si Eron, ọ si kwa Eleeza na Itama, bú umu-ya ndikom, Unu akọpula agiri-isi-unu, unu adọwa-kwa-la uwe-unu; ka unu we ghara inwu, ka Ọ we ghara kwa iwe iwe megide nzukọ Israel nile: ma ka umu-nne-unu, bu ulo nile nke Israel, kwara nsure-ọku ahu nke Jehova sureworo akwá. 7Unu esi-kwa-la n'ọnu-uzọ nke ulo-ikwū nzute pua, ka unu we ghara inwu: n'ihi na manu otite-manu nke Jehova dikwasi unu. Ha we me dika okwu Moses si di.
8Jehova we gwa Eron okwu, si, 9Aṅula manya-vine ma-ọbu ihe-ọṅuṅu nābà n'anya, gi onwe-gi, na umu-gi ndikom tiyere gi, mb͕e unu nābà n'ulo-ikwū nzute, ka unu we ghara inwu; ọ gābu ukpuru ebighi-ebi rue ọb͕ọ-unu nile: 10ka unu we kpa kwa ókè n'etiti ihe nsọ na ihe nādighi nsọ, na n'etiti ihe ruru árú na ihe di ọcha; 11ka unu we zí kwa umu Israel ukpuru nile nke Jehova gwaworo ha site n'aka Moses. 12Moses we gwa Eron okwu, ọ gwa kwa Eleeza na Itama, bú umu-ya ndikom fọduru, si, Werenu onyinye-inata-iru-ọma nke fọduru site n'àjà-ọku nke Jehova, rie ya n'ekoghi-eko na nso ebe-ichu-àjà: n'ihi na ihe nsọ kachasi ihe nsọ nile ka ọ bu. 13Unu gēri kwa ya n'ebe di nsọ, n'ihi na òkè-gi, na òkè umu-gi ndikom, ka ọ bu, sitere n'àjà-ọku nile nke Jehova: n'ihi na otú a ka enyeworom iwu. 14Okpukpu-obi nke àjà-ofufé na utaku-ukwu nke àjà-nbuli ka unu gēri kwa n'ebe di ọcha; gi onwe-gi, na umu-gi ndikom, na umu-gi ndinyom tiyere gi: n'ihi na dika òkè-gi na òkè umu-gi ndikom ka enyeworo ha site n'ihe àjà nile nke àjà-udo nile nke umu Israel. 15Utaku-ukwu nke àjà-nbuli na okpukpu-obi nke àjà-ofufé ka ha gēweta n'elu àjà-ọku nile nke abuba nile, ifé ya ka ọ buru àjà-ofufé n'iru Jehova: ọ gābu kwa nke gí, na nke umu-gi ndikom tiyere gi, dika òkè-unu ebighi-ebi; dika Jehova nyere iwu.
16Moses we chọsie nkpi nke àjà-nmehie ike, ma, le, esurewo ya ọku: ọ we iwe n'aru Eleeza na n'aru Itama, bú umu-ndikom Eron fọduru, si, 17Gini mere unu erighi àjà-nmehie n'ebe nke ebe nsọ ahu? n'ihi na ihe nsọ kachasi ihe nsọ nile ka ọ bu, ọ bu kwa ya ka O nyeworo unu ibupu ajọ omume nke nzukọ Israel, ikpuchiri ha nmechie-ha n'iru Jehova. 18Le, ebubataghi ọbara-ya n'ebe nsọ a nime: unu aghaghi iri ya n'ebe nsọ a, dika m'nyere iwu. 19Eron we gwa Moses okwu, si, Le, ta ka ha wetaworo àjà-nmehie-ha na àjà-nsure-ọku-ha nso n'iru Jehova; ihe dika ihe ndia we dakwasim: asi kwa na eririm àjà-nmehie ahu ta, ọ̀ gādi nma n'anya Jehova? 20Mb͕e Moses nuru ya, ọ we di nma n'anya-ya.
Nke Ahọpụtara Ugbu A:
LEVITIKỌS 10: IGBOB
Mee ka ọ bụrụ isi
Kesaa
Mapịa
Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye
Igbo Bible © Bible Society of Nigeria © 1906, 2006.