Nke diri umu Amon. Otú a ka Jehova siri: Ọ̀ dighi umu-ndikom Israel nwere? ọ̀ dighi onye-nnweta ihe-ya o nwere? Gini mere Malkam ji nweta Gad, ndi-ya we biri n'obodo-ya nile? N'ihi nka, le, ubọchi nābia, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), mb͕e M'gēme ka anuru udà-opì agha rue Raba nke umu Amon; ọ gāghọ kwa obo ebe tọb͕ọrọ n'efu, ọ bu kwa umu-ya ndinyom ka agēji ọku sure: Israel ewe nweta ndi nwetara ya-ri; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta. Kwasie ákwá ike, gi Heshbon, n'ihi na apunarawo Ai ihe-ya; tienu nkpu, unu umu-ndinyom nke Raba, kenu ákwà-nkpe n'úkwù: tienu aka n'obi, b͕aghari-kwa-nu n'ogige nile unu; n'ihi na Malkam gāla n'etiti ndi emere ka ha je biri n'ala ọzọ, ya na ndi-nchu-àjà-ya na ndi-isi-ya n'otù. Gini mere i ji ndagwurugwu nile anya isi? ndagwurugwu-gi nērùpu dika miri, gi ada nke nādaghachi azu, nke nātukwasi obi n'àkù-ya nile, si, Ònye gābiakutem? Le, M'gaje ime ka oké egwu biakwasi gi, (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, puta), site na ndi nile nọ gi buruburu; agāchupu kwa unu, onye ọ bula n'iru ya, ọ gaghi-adi kwa onye nāchikọta onye ọ bula nāwaghari. Ma emesia M'gēme ka umu Amon adọtara n'agha laghachi; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.
Nke diri Edom. Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: Amam-ihe, ọ̀ dighi kwa na Timan ọzọ? ndum-ọdu, ọ̀ lanariwo ndi-nghọta n'iyì? amam-ihe-ha, àwusiwo ya? B͕alaganu, chigharia, biri n'ebe di omimi, unu ndi bi na Dedan; n'ihi na nhuju-anya Isọ ka M'gēme ka ọ biakwasi ya, mb͕e M'gēleta ya. Ọ buru na ndi nāghọrọ nkpuru-vine abiakute gi, hà agaghi-aghọfọ nkpuru nke fọduru itutukọ? ọ buru na ndi-ori abia n'abali, hà agaghi-ebibi nke gēzuru ha? N'ihi na Mu onwem ab͕abawo Isọ ọtọ, ekpughepuwom ebe-nzuzo-ya nile, ọ pughi kwa izobe onwe-ya: apunariwo nkpuru-ya na umu-nne-ya na ndi-ab͕ata-obi-ya ihe-ha, ọ dighi kwa ndu. Rapu umu-nb͕ei-gi, Mu onwem gēdebe ha ndu; ka ndinyom-i di-ha nwuru tukwasim obi-ha. N'ihi na otú a ka Jehova siri: Le, ndi anēkpeghi ikpe iṅu n'iko ahu aghaghi iṅu; ma gi onwe-gi, ì gābu kwa onye ahu nke anāmaghi ikpe ma-ọli? I gaghi-abu onye anāmaghi ikpe, n'ihi na i ghaghi iṅu. N'ihi na Onwem ka M'jiri ṅu iyi, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), na ihe-iju-anya na ihe-ita-uta na nkpọnkpọ ebe na ihe-nkọcha ka Bọzra gāghọ; obodo-ya nile gāghọ kwa nkpọnkpọ ebe mb͕e ebighi-ebi. Akukọ ka m'nuworo sitere na Jehova, ọ bu kwa ukọ̀ ka ezigaworo n'etiti mba nile, si, Chikọtanu onwe-unu, bia imegide ya, bili-kwa-nu ibu agha. N'ihi na, le, mba di ntà ka M'meworo gi n'etiti mba nile, bú ihe-nlelì n'etiti madu. Idi-egwu-gi, nganga nke obi-gi arafuwo gi, gi onye bi na nb͕awa nile nke nkume ahu di elu, onye nējide ebe di elu nke ugwu ntà: n'ihi na asi na i me akwu-gi ka ọ di elu dika nke ugo, M'gēme ka i si n'ebe ahu ridata; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta. Edom gāghọ kwa ihe-iju-anya: o gēju onye ọ bula nke nāgabiga n'akuku ya anya, ọ gāma kwa ọsọ n'ihi ihe-otiti-ya nile. Dika nkwatu nke Sọdọm na Gọmọra na ab͕ata nile ha, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), ọ dighi onye ọ bula gēbi n'ebe ahu, nwa madu ọ bula agaghi-anọ kwa dika ọbìa nime ya. Le, dika ọdum ka ọ nārigo, bú nke si na nbili-elu nke Jọdan arigo, rue ebeita-nri nādigide mb͕e nile: ma n'otù ntabi-anya ka M'gēme ka o si n'aru-ya b͕a ọsọ; ma ònye bu onye arọputara arọputa? onye-nlekọta-ya ka M'gēme ya: n'ihi na ònye di kam? ọ̀ bu kwa onye gākaram mb͕e? ma-ọbu ònye bu kwa onye-ọzùzù-aturu a nke gēguzo n'irum? N'ihi nka nurunu ndum-ọdu Jehova, nke Ọ duworo megide Edom; na èchìchè-Ya nile, nke O chèworo megide ndi bi na Timan, si: N'ezie ha gādọkpupu ha, bú ndi ntà nke ìgwè ewu na aturu; n'ezie o gēju ebe-ita-nri-ha anya bayere ha. Site n'olu nke ọdida-ha uwa mara jijiji; iti-nkpu di, n'Oké Osimiri Uhie ka anuru olu-ya. Le, dika ugo ka ọ gārigo, fesie ike, b͕asa nkù-ya n'elu Bọzra: obi ndi-dike Edom n'ubọchi ahu gādi kwa ka obi nwanyi ime nēme.