Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

AISAIA 56:1-8

AISAIA 56:1-8 IGBOB

Otú a ka Jehova siri, Debenu ikpé ziri ezi, me-kwa-nu ezi omume: n'ihi na nzọputam di nso ibia, ezi omumem di kwa nso ka ekpughe ya. Onye ihe nāgara nke-ọma ka onye nēme nka na nwa madu nke nējidesi ya ike bu; onye nēdebe ubọchi-izu-ike ghara ime ya ka ọ ghara idi nsọ, nke nēdebe kwa aka-ya ghara ime ihe ọjọ ọ bula. Ka nwa ala ọzọ nke raparaworo na Jehova ghara ikwu okwu, si, Jehova aghaghi ikewapum na ndi-Ya: ka onozi ghara kwa isi, Le, mu onwem bu osisi kpọnwuru akponwu. N'ihi na otú a ka Jehova siri ndi-onozi ndi nēdebe ubọchi-izu-ikem nile, ndi rọputawo-kwa-ra ihe tọrọm utọ, ndi nējidesi kwa ọb͕ub͕a-ndum ike: M'gēnye, ha n'ulom na nime mb͕idim nile ihe-ncheta na aha di nma kari umu-ndikom, kari kwa umu-ndinyom; aha ebighi-ebi ka M'gēnye ha n'otù n'otù, nke anāgaghi-ebipu. Umu ala ọzọ kwa, ndi nārapara Jehova, ijere Ya ozi, na ihu aha Jehova n'anya, na iburu Ya ndi-orù, onye ọ bula nke nēdebe ubọchi-izu-ike ghara ime ya ka ọ ghara idi nsọ, nke nējidesi kwa ọb͕ub͕a-ndum ike; M'gēme ka ha biarue ugwu nsọm, M'gēme kwa ka ha ṅuria n'ulo-ekperem; àjà-nsure-ọku nile ha na àjà nile ha gābu ihe nātọ utọ n'elu ebe-ichu-àjàm: n'ihi na agākpọ ulom ulo ekpere diri ndi nile di iche iche. Ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi puta, bú Jehova Nke nāchikọta ndi Israel achupuru achupu, Ọ si, Ndi ọzọ di kwa M'gāchikọtara ya, chikọtara ndi-ya achikọtara achikọta.