Ma otù nwanyi nke nēso uzọ Jisus nọ na Jọpa, aha-ya bu Tabita, nke anākpọ Dọkas, ma asugharia ya: nwanyi a juputara n'ezi ọlu na ọlu ebere nke ọ nēme. Ma o ruru n'ubọchi ahu, na aru-ya adighi ike, o we nwua: mb͕e ha sasiri ya aru, ha tọbọ ya n'ime-ulo di n'elu ulo. Ma ebe Lida di Jọpa nso, ndi nēso uzọ Jisus, ebe ha nuru na Pita nọ n'ebe ahu, ha zigara ya ndikom abua, nāriọ ya, si, Alala azu ibiakute ayi. Pita we bilie so ha je. Ma mb͕e ọ biaruru, ha duru ya rigo n'ime-ulo ahu di n'elu ulo: ndinyom nile ndi di-ha nwuru guzo-kwa-ra ya nso nākwa ákwá, nēgosi kwa uwe-ime na uwe ọzọ, ka ha ra, bú nke Dọkas nēme mb͕e ya na ha nọ. Ma Pita chupuru ha nile n'èzí, we b͕ue ikperè n'ala, kpe ekpere; o we chigharia n'ebe ozu ahu di, si, Tabita, bilie. Nwanyi ahu we saghe anya-ya; mb͕e ọ huru Pita, o we nọlie. O we nye ya aka-ya, palie ya elu; mb͕e ọ kpọsiri ndi nsọ na ndinyom ndi di-ha nwuru, ọ che ya na ndu n'iru ha. Ewe mara ya na Jọpa dum: ọtutu madu we kwere n'Onye-nwe-ayi.
Gụọ ỌLU NDI-OZI 9
Geere nke a ntị ỌLU NDI-OZI 9
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: ỌLU NDI-OZI 9:36-42
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ulo
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ
Vidiyo