Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ỌLU NDI-OZI 7:20-43

ỌLU NDI-OZI 7:20-43 IGBOB

N'oge ahu ka amuru Moses, o we ma nma nke-uku; ewe zùa ya ọnwa atọ n'ulo-ya: ma mb͕e etufuru ya, nwa-nwanyi Fero paliri ya, zùa ya ka ọ buru nwa ya onwe-ya nwere. Ewe zí Moses ihe n'amam-ihe nile nke ndi Ijipt; o we di ike n'okwu-ya na ọlu-ya nile. Ma mb͕e o rubere ọgu arọ abua, ileta umu-nne-ya, bú umu Israel, batara n'obi-ya. Ma mb͕e ọ huru otù onye nime ha ka anēmejọ, ọ lubara ya ọ̀gù, we kpeputa onye anēmub͕u, ebe o tib͕uru onye Ijipt: ma o chère na umu-nne-ya ghọtara na Chineke nēsi n'aka-ya enye ha nzọputa; ma ha aghọtaghi. N'ubọchi soni o we me ka ha hu ya anya mb͕e ha nālu ọ̀gù, o we mebe ka ha dirita n'udo, si, Ndikom, unu bu umu-nne; gini mere unu nēmejọrita onwe-unu? Ma onye nēmejọ ibe-ya nupuru ya, si, Ònye mere gi ka i buru onye-isi na onye-ikpé n'ebe ayi nọ? Ọ̀ bu ib͕um ka gi onwe-gi nāchọ, dika i b͕uru onye Ijipt nyahuru? Moses we b͕alaga n'okwu a, we nọ dika ọbìa n'ala Midian, ebe ọ muru umu-ndikom abua. Mb͕e ọgu arọ abua zuru, ewe me ka ọ hu mọ-ozi n'ọhia nke ugwu Sainai, n'ire ọku nime osisi ntà. Ma mb͕e Moses huru ya, ihe ọ huru juru ya anya: ma mb͕e ọ nābiaru nso ikiri ya, olu nke Onye-nwe-ayi dara, si, Mu onwem bu Chineke nke nna-gi-hà, Chineke nke Abraham, na nke Aisak, na nke Jekob. Aru we ma Moses jijiji, o nweghi kwa anya-ike ikiri. Onye-nwe-ayi we si ya, Tọpu akpukpọ-ukwu n'ukwu-gi abua: n'ihi na ebe i nēguzo bu ala nsọ. N'ezie ahuwom ihe ọjọ anēme ndim nke di n'Ijipt, anuwokwam isu-udè-ha, M'we ridata iweputa ha: ub͕u a bia kwa, M'gēziga gi n'Ijipt. Moses nka, onye ha juru aju, si, Onye mere gi ka i buru onye-isi na ikpé? onye a ka Chineke ziteworo ibu onye-isi, ibu kwa onye-nb͕aputa, ya na aka mọ-ozi ahu nke emere ka ọ hu ya n'osisi ntà ahu. Nwoke a duputara ha, mb͕e ọ lusiri ọlu-ebube di iche iche na ihe-iriba-ama di iche iche n'Ijipt, na nime Oké Osimiri Uhie, na nime ọhia ọgu arọ abua. Onye a bu Moses ahu, onye siri umu Israel, Chineke gēme ka Onye-amuma, Nke di ka mu onwem, biliere unu site n'etiti umu-nne-unu. Nwoke a bu onye nānọri nime nzukọ n'ọhia, ya na mọ-ozi ahu nke gwara ya okwu n'ugwu Sainai, na nna-ayi-hà: onye nara okwu di ndu nke si n'ọnu Chineke puta inye ayi: onye nna-ayi-hà nāchọghi iṅa nti, kama ha nupuru ya n'ebe ha nọ, we laghachi azu n'Ijipt n'obi-ha, nāsi Eron, Mere ayi chi ndi ganēje n'iru ayi: n'ihi na Moses a, onye duputara ayi n'ala Ijipt, ayi amataghi ihe mere ya. Ha we kpua nwa-ehi n'ubọchi ahu, we butere arusi ahu ihe àjà, we ṅuria n'ọlu aka-ha. Ma Chineke chighariri, we rara ha nye ikpere usu ihe di n'elu-igwe; dika edeworo ya n'akwukwọ ndi-amuma, si, Ọ̀ di anu eb͕uru eb͕u na àjà unu wetaram Ọ̀gu arọ abua n'ọhia, unu ulo Israel? Unu we palie ulo-ikwū nke Mọlọk, Na kpakpando nke chi ahu, bú Refan, Ihe-atù unu mere ikpọ isi ala nye ha: M'gēme kwa ka unu je biri n'ofè Babilon.