Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

II. NDI-EZE 8:1-15

II. NDI-EZE 8:1-15 IGBOB

Ma Elaisha gwara nwayi ahu okwu, bú onye o mere ka nwa-ya nwoke di ndu, si, Bilie, je, gi onwe-gi na ulo-gi, nọ dika ọbìa n'ebe ọ bula i gānọ dika ọbìa: n'ihi na Jehova akpọwo oké unwu ka ọ da: ọzọ kwa, ọ gābiakwasi ala arọ asa. Nwayi ahu we bilie, me dika okwu onye nke Chineke si di: ọ we je, ya onwe-ya na ulo-ya, nọ dika ọbìa n'ala ndi Filistia arọ asa. O rue, n'ọgwugwu arọ asa ahu, na nwayi ahu si n'ala ndi Filistia lata: ọ pua itiku eze nkpu bayere ulo-ya na ala-ya. Ma eze nāgwa Gihezi, bú nwa-okorọbia onye nke Chineke, okwu, si, Biko, kọrọm akukọ ihe uku nile nke Elaisha meworo. O rue na, mb͕e ya onwe-ya nākọrọ eze otú o mere ka onye nwuru anwu di ndu ọzọ, le, nwayi ahu, onye o mere ka nwa-ya nwoke di ndu ọzọ nētiku eze nkpu bayere ulo-ya, baye-kwa-ra ala-ya. Gihezi we si, Onye-nwem eze, nka bu nwayi ahu, nka bu kwa nwa-ya nwoke, onye Elaisha mere ka ọ di ndu ọzọ. Eze we jua nwayi ahu, o we kọrọ ya akukọ ahu. Eze we nye ya otù onye nējere ya ozi, si, Nyeghachi ihe nile o nwere, na ihe-ọmume nile nke ubi site n'ubọchi ọ rapuru ala-ya, we rue ub͕u a. Elaisha we biarue Damaskọs; ma Ben-hedad, bú eze Siria, nāria ọria; ewe gosi ya, si, Onye nke Chineke abiawo n'ebe a. Eze we si Hazael, Were onyinye-inata-iru-ọma n'aka-gi, je izute onye nke Chineke, jua Jehova ase site n'aka-ya, si, M'gādiri ndu n'ọria nka? Hazael we je izute ya, were onyinye-inata-iru-ọma n'aka-ya, bú ezi ihe nile nke Damaskọs, ibu ọgu camel abua gēbu, o we bia guzo n'iru ya, si, Nwa-gi, bú Ben-hedad eze Siria, ezìwom biakute gi, si, M'gādiri n'ọria nka? Elaisha we si ya, Je, si ya, I ghaghi idiri ndu; ma Jehova emewo ka m'hu na ọ ghaghi inwu. Ọ we legide ya anya, che ya iru, rue mb͕e ihere mere ya: onye nke Chineke we kwa ákwá. Hazael we si, Gini mere onye-nwem nākwa ákwá? Ọ si, N'ihi na amawom ihe ọjọ nke i gēme umu Israel: i gēsu ebe nile ha ewusiri ike ọku, i gēwere kwa mma-agha b͕ue umu-okorobia-ha, i gātupia kwa umu-ha nāṅu ara, i gāb͕awa ndinyom-ha di ime afọ. Hazael we si, Ma gini bu orù-gi, bú nkita nka, na ọ gēme ihe uku a? Elaisha we si, Jehova emewo ka m'hu na i gābu eze Siria. O we si n'ebe Elaisha nọ la, biakute onye-nwe-ya; ọ si ya, Gini ka Elaisha siri gi? Ọ si, Ọ sirim na i ghaghi idiri ndu. O rue, n'echi-ya, na ọ chiri ákwà-ob͕ub͕o, biaye na miri, b͕asa ya n'iru-ya, ọ we nwua: Hazael we buru eze n'ọnọdu ya.