Ma ebe ayi nwere otù mọ nke okwukwe ahu, dika ihe edeworo n'akwukwọ nsọ si di, Ekwerem, n'ihi ya ka m'kwuru; ayi onwe-ayi kwere kwa, ọ bu kwa n'ihi ya ka ayi nēkwu; ebe ayi matara na Onye ahu Nke mere ka Onye-nwe-ayi Jisus si n'ọnwu bilie, na Ọ gēme kwa ka ayi so Jisus si n'ọnwu bilie, Ọ gēche kwa ayi na unu n'iru Onwe-ya. N'ihi na ihe nile di n'ihi unu, ka amara, ebe o riri nne site n'aka ndi ka n'ọnu-ọgugu, ka o we me ka ikele-ekele babiga ókè rue ebube nke Chineke. N'ihi nka ike agwughi ayi n'obi; kama asi na ọ bu ezie na madu elu-aru ayi nēre uré, ma anēme ka madu ime ayi buru ihe ọhu kwa-ubọchi. N'ihi na nkpab͕u-ayi nke di nfé, nke di na nwa oge a, nāluputara ayi ebube nke-uku ri nne kachasi ihe nile, bú ebube nke di arọ́ di kwa ebighi-ebi; ebe ayi nādighi-ele ihe anāhu anya, kama ihe anādighi-ahu anya: n'ihi na ihe anāhu anya nādiru nwa oge; ma ihe anādighi-ahu anya di ebighi-ebi.
Gụọ II. NDI KỌRINT 4
Geere nke a ntị II. NDI KỌRINT 4
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: II. NDI KỌRINT 4:13-18
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị