Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

I. NDI KỌRINT 15:1-19

I. NDI KỌRINT 15:1-19 IGBOB

Ma emem ka unu mara, umu-nnam, ozi ọma ahu nke m'zìri unu, nke unu nata-kwa-ra, nke unu nēguzo kwa nime ya, nke esite-kwa-ra zọputa unu, ma ọ buru na unu jidesie ya ike, bú aha okwu m'ji zì unu ozi ọma ahu, ma asi na ọ bughi na unu kwere n'efu. N'ihi na enyerem n'aka-unu na mbu ihe m'nata-kwa-ra idebe, na Kraist nwuru n'ihi nmehie-ayi nile, dika ihe edeworo n'akwukwọ nsọ si di; na elì-kwa-ra Ya; na emewo-kwa-ra ka O si n'ọnwu bilie n'ubọchi nke-atọ, dika ihe edeworo n'akwukwọ nsọ si di; na O me-kwa-ra ka Kifas hu Ya anya; emesia O mere ka ndi-ozi iri na abua ahu hu Ya anya; emesia O mere ka ndi kari nnù madu na ọgu ise n'etiti umu-nna-ayi hu Ya anya n'otù mb͕e, ndi ka n'ọnu-ọgugu n'etiti ndi ahu nānọgide rue ub͕u a, ma ufọdu adawo n'ura ọnwu; emesia O mere ka Jemes hu Ya anya; emesia O mere ka ndi-ozi nile hu Ya anya; ma n'ikpe-azu ha nile, dika nwa amukworo amukwo, O mere ka mu onwem hu kwa Ya anya. N'ihi na mu onwem dikarisiri ntà n'etiti ndi-ozi, ebe m'nērughi ka akpọm onye-ozi, n'ihi na esob͕urum nzukọ Chineke. Ma site n'amara Chineke abum ihe m'bu: ahu-kwa-ra na amara-Ya nke enyerem abughi ihe-efu; kama adọb͕ubigaram onwem ókè n'ọlu kari ha nile: ma ọ bughi mu onwem, kama amara Chineke nke sorom. Ya mere ma ọ buru mu onwem, ma-ọbu ndi ahu, otú a ka ayi nēkwusa, otú a ka unu kwe-kwa-ra. Ma ọ buru na anēkwusa na emewo ka Kraist si na ndi nwuru anwu bilie, ùfọdu n'etiti unu si aṅa nēkwu na nbilite-n'ọnwu nke ndi nwuru anwu adighi? Ma ọ buru na nbilite-n'ọnwu nke ndi nwuru anwu adighi, emeghi kwa ka Kraist si n'ọnwu bilie: ma ọ buru na emeghi ka Kraist si n'ọnwu bilie, ya mere ihe ayi nēkwusa bu ihe-efu, okwukwe-unu bu kwa ihe-efu. Ọzọ kwa, anāhu na ayi bu ndi-àmà ugha nke Chineke; n'ihi na ayi b͕ara àmà megide Chineke na O mere ka Kraist ahu si n'ọnwu bilie; bú Onye Ọ nēmeghi ka O si n'ọnwu bilie, ma ọ buru na ọ bu ezie na emeghi ka ndi nwuru anwu si n'ọnwu bilie. N'ihi na asi na emeghi ka ndi nwuru anwu si n'ọnwu bilie, emeghi kwa ka Kraist si n'ọnwu bilie: ma ọ buru na emeghi ka Kraist si n'ọnwu bilie, okwukwe-unu bu ihe-efu; unu nānọ na nmehie nile unu ub͕u a. Ya mere ndi da-kwa-ra n'ura ọnwu nime Kraist lara n'iyì. Asi na ọ bu nání na ndu a ka ayi nweworo olile-anya-ayi nime Kraist, ayi bu ndi kwesiri ebere kari madu nile.