N'ihi na achọghm, umu-nnam, ka unu ghara imara, na nna-ayi-hà nile nọri n'okpuru igwe-oji ahu, ha nile gabiga-kwa-ra oké osimiri ahu; eme-kwa-ra ha nile baptism ibà nime Moses nime igwe-oji ahu na nime oké osimiri ahu; ha nile ri-kwa-ra otù ihe-oriri ahu nke mọ; ha nile ṅu-kwa-ra otù ihe-ọṅuṅu ahu nke mọ: n'ihi na ha nāṅu miri nke si na nkume nke mọ nke soro ha: nkume ahu bu kwa Kraist. Ma ihe ndi kari n'etiti ha adighi Chineke ezi nma: n'ihi ya akwaturu ha n'ọhia. Ma ihe ndia ghọrọ ihe-atù nye ayi, ka ayi we ghara ibu ndi agu ihe ọjọ nāgu, dika agu ihe ọjọ gu-kwa-ra ndi ahu. Unu aghọ-kwa-la ndi nēkpere arusi, dika ufọdu n'etiti ha ghọrọ; dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ, si, Ndi Israel nọduru ala iri ihe na iṅu ihe, ha we bilie igwu egwú. Ka ayi ghara kwa ikwa iko, dika ufọdu n'etiti ha kwara, we da nwua n'otù ubọchi, ọgu nnù madu abua na nnù iri na asa na ọgu iri. Ka ayi ghara kwa inwa Onye-nwe-ayi, dika ufọdu n'etiti ha nwara, agwọ we la ha n'iyì. Unu atamu-kwa-la, dika ufọdu n'etiti ha tamuru, onye-nbibi ahu we la ha n'iyì. Ma ihe ndia nēmeri ndi ahu n'uzọ ihe-atù; ewe de ha n'akwukwọ nsọ ka ha we buru ihe idu ayi ọdú, ndi ọgwugwu oge ndia ruteworo. Ya mere, onye nēchè na o nēguzo, ya lezi anya ka ọ ghara ida. Ọ dighi ọnwunwa ọ bula nwaworo unu ma-ọbughi nke madu nānagide: ma Chineke kwesiri ntukwasi-obi, Onye nāgaghi-ekwe ka anwa unu kari nke unu puru inagide; kama n'oge ọnwunwa ahu Ọ gēme kwa uzọ nb͕apu, ka unu we nwe ike inagide ya.
N'ihi nka, ndi m'huru n'anya, b͕anarinu ikpere-arusi. Anamekwu dika anamagwa ndi nwere uche; unu onwe-unu tule ihe m'nēkwu. Iko nke ngọzi ahu nke ayi nāgọzi, ọ̀ bughi nnwekọ ọbara Kraist? Achicha ahu nke ayi nānyawa, ọ̀ bughi nnwekọ aru Kraist? n'ihi na otù achicha di, ayi, ọ bu ezie na ayi di ọtutu, ma ayi bu otù aru: n'ihi na ayi nile nēketa òkè n'otù achicha ahu. Lenu Israel dika anu-aru si di: ndi nēri àjà, hà na ebe-ichu-aja adighi-enwekọ? Gini kwa ka m'nēkwu? nà ihe achuru n'aja nye arusi bu ihe ọ bula, ma-ọbu na arusi bu ihe ọ bula? Kama okwu m'nēkwu bu, na ihe ndi mba ọzọ nāchu n'àjà, ha nāchuru ndi-mọ ọjọ, ọ bughi kwa Chineke ka ha nāchuru: ma achọghi m ka unu ghọ ndi unu na ndi-mọ ọjọ nēnwekọ.