“Unu ndị ọgbọ a, tuleenụ okwu nke ONYENWE ANYị: “O nweela mgbe m bụ ọzara nye ndị Izrel ma ọ bụkwanụ ala gbara oke ọchịchịrị? Gịnị mekwaranụ ndị m ji na-asị, ‘Anyị enwerela onwe anyị ịwagharị, anyị agaghị abịakwutekwa gị ọzọ’? Nwaagbọghọ ọ na-echefu ọla ịchọ mma ya, nwanyị a na-alụ ọhụrụ ọ na-echefu ngwa ịchọ mma ya? Ma nʼime ọtụtụ ụbọchị nke a na-apụghị ịgụta ọnụ, ndị m echefuola m. Lee ka unu si bụrụ ndị ọka nʼịgbaso ịhụnanya. Ọ bụladị ụmụ nwanyị dị njọ karịsịa nwere ike ịmụta ihe site nʼụzọ unu. Nʼuwe unu ka achọtara ọbara ndị ogbenye na-enweghị ihe ọjọọ ha mere, nʼagbanyeghị na unu ejideghị ha ka ha nʼagbaka ụzọ. Ma unu gara nʼihu na-asịkwa, ‘Emeghị m ihe ọjọọ, ọ dịghị eweso m iwe.’ Ma aga m ekpe unu ikpe, nʼihi na unu na-asị, ‘Emeghị m mmehie.’ Gịnị mere unu ji na-akpagharị na-agbanwe ụzọ unu ọtụtụ mgbe? Ijipt ga-etinye unu nʼọnọdụ ihere dịka ndị Asịrịa mere unu. Unu ga-ebu aka unu nʼisi mgbe unu si ebe ahụ na-apụ, nʼihi na ONYENWE ANYị ajụla ndị ahụ unu tụkwasịrị obi. Ha agaghị enyere unu aka.
Gụọ Jeremaya 2
Geere nke a ntị Jeremaya 2
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: Jeremaya 2:31-37
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ulo
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ
Vidiyo