Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Aịzaya 30:1-11

Aịzaya 30:1-11 BIU

“Ahụhụ ga-adịrị ụmụ ndị nnupu isi,” otu a ka ONYENWE ANYị kwupụtara, “bụ ndị na-agbaso nzube nke na-esiteghị nʼaka m, ndị ha na ndị ọzọ na-agba ndụ nke Mmụọ m na-anabataghị, si otu a na-eme ka mmehie na-aba ụba nʼelu mmehie. Ndị na-aga Ijipt ịchọ enyemaka ma ha ajụtaghị ase site nʼaka m. Ndị were obi ha tụkwasị na Fero maka nchebe, chọsiekwa ike ime Ijipt ebe mgbaba. Ma nchekwa Fero ga-aghọrọ unu ihe ihere, ndo ndị Ijipt ga-etinye unu nʼọnọdụ mweda nʼala. Ọ bụ ezie na ha nwere ndị ozi na Zoan ndị nnọchi anya ha erutekwala Hans, ihere ga-eme onye ọbụla nʼihi ndị na-abaghị uru nye ha, ndị na-abụghị ihe inyeaka maọbụ ihe iba uru, kama naanị ihe ihere na ịta ụta.” Amụma banyere ụmụ anụmanụ bi na Negev. Nʼala ahụhụ na mkpagbu, nke ọdụm na nne ọdụm, nke ajụala na agwọ ọjọọ na-efe ka ọkụ, ndị nnọchite anya obodo na-ebu akụ ha niile nʼelu ịnyịnya ibu, na-ebukwa akụnụba ha dị oke ọnụahịa nʼelu ịnyịnya kamel, na-agakwuru mba ahụ na-abaghị uru, bụ Ijipt, ndị inyeaka ha na-enye enweghị isi. Nʼihi nke a, ana m agụ ya Rehab, onye na-enweghị ihe ọ na-arụ. Gaa ugbu a, dekwasịrị ha ya nʼelu mbadamba nkume, detuokwa ha nʼime akwụkwọ, ka ọ dịrị maka ụbọchị na-abịa dịka ihe akaebe ruo mgbe ebighị ebi. Nʼihi na ndị a bụ ndị na-enupu isi, ụmụ aghụghọ ndị kpachaara anya jụ ịnabata ozizi ONYENWE ANYị na-ezi. Ha na-agwa ndị ọhụ ụzọ, “Unu ahụkwala ọhụ, o zuola,” ma sịkwa ndị amụma, “Mechienụ ọnụ! Unu ahụtakwarala anyị ihe ziri ezi nʼọhụ unu. Gwanụ anyị ihe na-atọ ụtọ na ntị, buonu amụma nduhie. Unu na-anọchiri anyị ụzọ, nyenụ anyị ohere. Anyị achọkwaghị ịnụ ihe ọbụla banyere onye ahụ unu na-akpọ Onye dị nsọ nke Izrel.”