ONYENWE ANYị Chineke kụrụ ubi a gbara ogige nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ, nʼIden. O tinyere mmadụ ahụ ọ kpụrụ nʼime ubi a. ONYENWE ANYị Chineke mere ka osisi dị iche iche si nʼala pupụta, osisi ndị dị mma ile anya na nke dịkwa mma iri eri. Nʼetiti ogige a, e nwere osisi na-enye ndụ, na osisi nke ịmata ihe ọma na ihe ọjọọ. E nwere iyi si nʼIden na-asọpụta na-asọbanye nʼime ogige ahụ ime ka ala ahụ nwee mmiri. Site nʼebe ahụ, iyi a kewara nwee ngalaba anọ. Aha ngalaba nke mbụ bụ Paịshọn. Ọ sọọrọ ogologo gafee ala niile nke Havila, ebe a na-enweta ọlaedo. (Ọlaedo dị nʼala ahụ mara mma. Eso osisi na-esi isi ụtọ na nkume dị oke ọnụahịa a na-akpọ ọniks dịkwa nʼebe ahụ.) Aha ngalaba nke abụọ bụ Gaihọn. O sitere nʼala Kush gafee. Aha osimiri nke atọ bụ Taịgris. Ọ na-asọla nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ nke ala Ashọ. Aha osimiri nke anọ bụ Yufretis. ONYENWE ANYị Chineke weere mmadụ ahụ tinye ya nʼogige Iden, ka ọ na-akọ ya ma bụrụkwa onye na-elekọta ya. ONYENWE ANYị Chineke nyere mmadụ ahụ iwu sị ya “I nwere ike iri mkpụrụ osisi niile dị nʼubi a, ma ị gaghị eri mkpụrụ si nʼosisi ịmata ihe ọma na ihe ọjọọ. Nʼihi na ụbọchị i riri ya ị ga-anwụrịrị.”
Gụọ Jenesis 2
Geere nke a ntị Jenesis 2
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: Jenesis 2:8-17
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị