“Ọ bụ nʼoge a ka a mụrụ Mosis, ọ mara mma nke ukwuu nʼanya Chineke. A zụrụ ya naanị ọnwa atọ nʼụlọ nna ya. Mgbe e tufuru ya, ada Fero kpọọrọ ya, zụọ ya dị ka nwa nwoke nke aka ya. A zụrụ Mosis nʼamamihe niile nke ndị Ijipt, ọ bụrụ dike nʼokwu na nʼọrụ ịtụnanya.
“Mgbe ọ gbara iri afọ anọ, ọ batara ya nʼuche ịga ileta ụmụnna ya ndị Izrel. Mgbe ọ hụrụ otu onye nʼime ha nke onye Ijipt na-emegide ya, ọ lụtara ya ọgụ, bọtakwara ya ọbọ site nʼigbu onye Ijipt ahụ. Mosis chere na ụmụnna ya ga-aghọta na Chineke akpọlitela ya isite nʼaka ya napụta ha. Ma ha aghọtaghị. Nʼụbọchị ọzọ sonụ, Mosis hụrụ ụmụnna ya ndị Izrel abụọ ka ha na-alụ ọgụ. Ọ gbalịrị ime ka udo dịrị nʼetiti ha, sị, ‘Unu bụ ụmụnna, gịnị mere unu ji emejọrịta onwe unu?’
“Ma nwoke ahụ nke na-emegbu nwanna ya nupuru ya sị, ‘Onye mere gị onyeisi na onye ikpe nʼetiti anyị? Ị na-achọ igbu m dị ka i si gbuo onye Ijipt ụnyaahụ?’ Mgbe ọ nụrụ nke a, Mosis gbara ọsọ, gaa biri dị ka ọbịa nʼala Midia. Nʼebe ahụ ka ọ nọ mụta ụmụ nwoke abụọ.
“Mgbe iri afọ anọ gafere, e mere ka Mosis hụ mmụọ ozi nʼọkụ na-ere ọhịa dị nʼọzara, nʼakụkụ Ugwu Saịnaị. Ma mgbe ọ hụrụ nke a, o juru ya anya. Dị ka ọ na-agaru nso ka o leruo ya anya, ọ nụrụ olu Onyenwe anyị ka ọ dara, sị, ‘Abụ m Chineke nna nna gị ha. Chineke nke Ebraham, nke Aịzik na nke Jekọb.’ Ụjọ mere ka Mosis maa jijiji, na o nweghị ike ilegide ya anya.
“Ma Onyenwe anyị gwara ya, ‘Yipụ akpụkpọụkwụ gị. Nʼihi na ebe ahụ i guzo bụ ala dị nsọ. Ahụla m otu e si akpagbu ndị m nọ nʼala Ijipt. Anụla m ịsụ ude ha bịakwa ịzọpụta ha. Ugbu a bịa, aga m ezighachi gị nʼIjipt.’
“Ọ bụ otu Mosis ahụ ha jụrụ ajụ, mgbe ha sịrị, ‘Onye mere gị onyeisi na onye ikpe?’ Ọ bụkwa ya ka Chineke zigara ị bụ onyeisi na onye nnapụta ha, site nʼinyeaka mmụọ ozi ahụ mere ka ọ hụ ya nʼọhịa ahụ. O duuru ha pụta mgbe ọ rụsịrị ọrụ ebube na ihe ịrịbama dị iche iche nʼala Ijipt, na nʼOsimiri Uhie na nʼọzara iri afọ anọ.
“Onye a bụ Mosis ahụ gwara ụmụ Izrel, sị, ‘Chineke ga-eme ka onye amụma nke dị ka m, biliere unu site nʼetiti ụmụnne unu.’ Ya onwe ya nọ nʼọgbakọ nʼọzara, ya na mmụọ ozi ahụ gwara ya okwu nʼUgwu Saịnaị, na nna nna anyị ha; ebe ọ natakwara okwu dị ndụ inye anyị.
“Ma nna nna anyị ha jụrụ irubere ya isi. Kama ha nupuru ya nʼakụkụ, ma tụgharịa laghachi azụ nʼIjipt nʼobi ha, na-asị Erọn, ‘Meere anyị chi, ndị nke ga-edu anyị, nʼihi na anyị amaghị ihe mere nwoke a bụ Mosis, onye sitere nʼala Ijipt dupụta anyị.’ Ha kpụụrụ onwe ha arụsị nke oyiyi nwa ehi, ha butere ihe ịchụ aja nye ya. Ha ṅụrịrị ọṅụ nʼọrụ nke aka ha. Ma Chineke chepuru ihu ya site nʼebe ha nọ. Ọ rara ha nye ikpere usuu ihe dị nʼeluigwe. Nke a dabara nʼihe e dere nʼakwụkwọ ndị amụma,
“ ‘Unu ụlọ Izrel, unu o wetara m onyinye anụ e gburu egbu ka ọ dị aja unu chụụrụ m
iri afọ anọ unu nọrọ nʼọzara?
Unu buliri ụlọ ikwu nke Mọlọk
na kpakpando nke chi unu bụ Refan,
bụ arụsị ndị ahụ unu mere ịkpọ isiala nye ha.
Ya mere, aga m ewezuga unu, burukwa unu gaa nʼofe obodo Babilọn.’