Ụmụnna m, ugbu a achọrọ m ime ka unu cheta oziọma ahụ m ziri unu mgbe m buru ụzọ bịakwute unu, nke unu kweere na ya, na nke unu guzosikwara ike nʼelu ya. E si nʼoziọma a zọpụta unu, ma ọ bụrụ na unu ejiri obi unu niile jidesie ihe unu kweere na ya ike. Inwe okwukwe nʼihe ọzọ dị iche agaghị enyere unu aka.
Ihe m nyefere unu nʼaka na mbụ bụ ozi ahụ m natara ị debe, nke dị oke mkpa, na Kraịst nwụrụ ọnwụ nʼihi mmehie anyị, dịka akwụkwọ nsọ kwuru na ọ ga-anwụ. Na e liri ya, ma e mere ka o si nʼọnwụ bilie nʼụbọchị nke atọ, dịka akwụkwọ nsọ kwukwara na ọ ga-eme. O gosiri Sefas onwe ya, emesịa, ndị ozi iri na abụọ ahụ hụkwara ya. Emesịakwa, o gosiri ihe karịrị narị mmadụ ise nʼime ụmụnna onwe ya, nʼotu mgbe, ọtụtụ nʼime ndị ahụ ka nọ ndụ taa, ọ bụ ezie na ụfọdụ nʼime ha adaala nʼụra ọnwụ. Emesịa, Jemis hụrụ ya; o mekwara ka ndị ozi niile hụ ya. Nʼikpeazụ, mụ onwe m hụkwara ya, dịka a ga-asị na m bụ nwa a na-amụghị nʼoge.
Nʼihi na ọ bụ m kachasị nta nʼime ndị ozi. O kwesikwaghị ka a akpọọ m onyeozi ya nʼihi na alụsoro m nzukọ Chineke ọgụ nke ukwuu. Ma site nʼamara nke Chineke, abụ m ihe m bụ. Ọ pụtakwara na amara ya nʼebe m nọ abụghị ihe efu. Kama arụsịrị m ọrụ ike karịchasịa ndị ozi niile. Ma nʼezie, ọ bụghị m na-arụ ọrụ a, kama ọ bụ Chineke nʼonwe ya na-arụ ọrụ ya nʼime m. Ma ọ bụ m, maọbụ ndị ọzọ, otu a ka anyị siri kwusaa, otu a ka unu sikwa kwere.
Ma ọ bụrụ na a na-ekwusa na Kraịst si nʼọnwụ bilie, gịnị mere ụfọdụ unu ji na-ekwu na ndị nwụrụ anwụ apụghị isi nʼọnwụ bilie ọzọ. Ọ bụrụ na ndị nwụrụ anwụ a pụghị i si nʼọnwụ bilie, nke a pụtara na e meghị ka Kraịst site nʼọnwụ bilie. Ọ bụrụkwa na e meghị ka Kraịst si nʼọnwụ bilie, ihe anyị na-ezisa bụ ihe efu, okwukwe unu nwere bụkwa ihe efu. Ma karịa nke a, a na-ahụta anyị ka ndị ama ụgha nke Chineke, nʼihi na anyị gbara ama banyere Chineke, na-asị na o mere ka Kraịst si nʼọnwụ bilie, bụ onye ọ na-emeghị ka o si nʼọnwụ bilie ma ọ bụrụ na-emeghị ka ndị nwụrụ anwụ dị ndụ ọzọ. Nʼihi na, ọ bụrụ na a pụghị ime ka ndị nwụrụ anwụ bilie dị ndụ ọzọ, emekwaghị ka Kraịst si nʼọnwụ bilie. Ma ọ bụrụ na-emeghị ka Kraịst si nʼọnwụ bilie, okwukwe unu bụ ihe efu, unu ka ga-anwụ na mmehie unu. Mgbe ahụ ndị nwụrụ anwụ nʼime Kraịst lara nʼiyi. Ọ bụrụkwa na olileanya anyị nʼime Kraịst gwụrụ naanị na ndụ anyị nʼime ụwa a, anyị bụ ndị e kwesiri ka e mere ebere.