Atụmatụ Ihe Ọgụgụ Gasị Dị N’efu na Ihe Ofufe Gasị metụtara MATIU 6:33
Wepụ Ụjọ
Ụbọchị 3
Ị nwere ike imeri mmetụta ụjọ. Dr. Tony Evans na-edu gị n'ụzọ nke nnwere onwe n'ime atụmatụ ihe ọgụgụ a n'enye mmepe anya. Chọpụta ndụ nke añụrị na udo nke ị na-achọ kemgbe ka ị na-eme ihe ndị bụ eziokwu n'enweghi mgbaga ewepụtara n'ime atụmatụ a
Ihe Niile M Chọrọ
Ubọchi atọ
Chineke agaala n'ihu anyị wee chebe anyị n'azụ. Ọ mechaworị alụ m agha anyị. Ọ kpuchigori ebe ekpụ m isi anyi. Ihe nrụrọ obula anaghị atụ Ya n'anya. Ihe Ofufe nke ụbọchị ato a agbadoro anya, ga ahapụ gi idi mgbamume n'ime eziokwu, na Chineke bụ onye na-enye oke kponkwem, nha kponkwem, maka ndụ gị.
Jizọs, Achọrọ M Gị!
Ụbọchị Atọ
Inwe Jizọs dị ka enyi na ndụ gị ọ bụ ihe dị gị oké mkpa? Atụmatụ ihe ọgụgụ a nke ụbọchị atọ bụ nke emebere iji mee ka ọnịnọ gị na Jizọs dịkwuo oké omimi ma nyere gị aka itikụ̀ Ya. Ọ bụkwa ekpere nsogidé nye usoro agụmagụ bụ “Jizọs, Achọrọ M Gị” sitere na Thistlebend Ministries.
Agụụ
4 Ụbọchị
Atụmatụ maka ụbọchị anọ a na-enyocha etú agụụ na-agụ anyị ịmata Chineke ma mee kà amata Ya, sì àkpali anyị n’ime nzube Ya maka ndụ anyị. Chọpụta ihe mere Devid ji bụrụ nwoke na-eso obi Chineke - na etu gị onwe gị ga-esi ebi ndụ na-enwe mmasị n'ebe Chineke nọ, na-egori mmekọrịta gị na Jizọs, na-atụkwasị ya obi ka o gboo mkpa gị. YouVersion chepụtara atụmatụ a.
Nchedo: Izere akwa ụta na ndụ gị
ụbọchị ise
Nchedo a na-etinye iji gbochie ugbo ala anyị site na I banye na ebe ndị dị ize ndụ ma ọ bụ na-agaghị apụ. Anyị anaghị ahụkarị ha ruo mgbe anyị chọrọ ha — mgbe ahụ anyị ji n'aka na ha nwere ekele na ha nọ ebe ahụ. Gịnị ma ọ bụrụ na anyị nwere nchedo na mmekọrịta anyị, akụnụba anyị, na ọrụ anyị? Kedu ihe ndị ahụ nwere ike ịdị ka? Olee ihe ha ga-eme ka anyị ghara ịkwa ụta ọ bụla? Maka ụbọchị ise sochirinụ, ka anyị nyocha etu esi edobe nchedo nkeonwe anyi.
Nkwa Ahụ
Ubọchị 6
N'ime Atụmatụ Akwụkwọ Nsọ ndi Life.Church a, di na nwunye isii na -ede maka nkwa agbamakwụkwọ isii nke ha na -ekwughi n'ihu ọha ebe ịchụàjà. Nkwa ndị a nke nkwadebe, ihe kacha mkpa, nchụso, mmekọ, ịdị ọcha na ekpere bụ nkwa na -eme ka alụmdi na nwunye rụọ ọrụ ogologo oge gafere agbamakwụkwọ. Ma ị lụrụ di ma ọ bụ nwunye ma ọ bụ na -eche maka ya, oge eruola ime nkwa ahụ
Igodo Asaa Iji Nweta Mmetụta Uche Zuru Okè
Ụbọchi Asaa
Enwere ma ọ dịkarịa-ala akụkụ asaa bụ isi nke izu-oke n'ịchọ ihe nke Chineke kacha mma maka ọdị nma ndụ mmetụta uche gị. Ọ dịghị mkpa ka iwere ha n'usoro n'usoro. Soro Dr. Charles Stanley ka ọ na-enyere gị aka iwulite àgwà ndị bụ isi n'ime ndụ gị nke ga-enyere gị aka itozu-oke na mmụọ na mmetụta-uche gị. Chọpụta atụmatụ ọgụgụ dị ka nke a na intouch.org/plans.
Mee Njem N'ebughí Nnukwu Ibu
Ụbọchi Asaa
N'oge Ekeresimesi jupụtará n'ihe aga eme-eme, ọtụtụ n'ime anyị na-enwe nsogbu na ntakasị-ahụ nke mmekọrịta ezinụlọ, ego ezughị okè, mkpebi ana echezighị echezi wee mee, na ndakpọ olileanya ihe a tụrụ anya ya. Ya mere gaa n'ihu. Kutú obere ume ndụ. Malite Atụmatụ Ihe Ọgụgụ Nke Akwụkwọ Nsọ a nke Life.Church ka ị wee ghọta na ibu ndị a n'anyigbu anyị nwere ike ịbụ ihe ndị Chineke na-agwaghị anyị ka anyị buru. Ọ́ gaghị́ adị mma ma anyị hapụchaa ibu arụ ndị a? Ka anyị mee njem n'egbughí nnukwu ibu.
Nchegbu N'efu
Ụbọchị asaa
Ma ọ bụrụ na e nwere ụzọ ka mma ịlụso nchegbu na-adịghị agwụ agwụ na-eme ka ị na-ehi ụra n'abalị? Ezi ezumike dị—ma nwere ike di nso karịa ka ị chere. Jiri udo dochie ụjọ site na atụmatụ Akwụkwọ Nsọ ụbọchị asaa a sitere na Life.Church, na-esote usoro ozi Pastọ Craig Groeschel Nchegbu N'efu.