YouVersion Logo
Search Icon

JEMES 4:7-12

JEMES 4:7-12 IGBOB

Ya mere donu onwe-unu n'okpuru Chineke; ma guzogidenu ekwesu, ọ gāb͕apu kwa n'ebe unu nọ. Biarunu Chineke nso, Ọ gābiaru kwa unu nso. Menu ka aka-unu di ọcha, unu ndi-nmehie; me-kwa-nu ka obi-unu di ọcha, unu ndi nwere uche abua. Hujunu anya, ru-kwa-nu újú, kwa-kwa-nu ákwá: ka ọchì-unu ghọ iru-újú, ka ọṅù-unu ghọ kwa nb͕aru-iru. Wedanu onwe-unu n'iru Onye-nwe-ayi, Ọ gēweli kwa unu elu. Umu-nnam, unu ekwutọritala ibe-unu. Onye nēkwutọ nwa-nna-ya, ma-ọbu nēkpe nwa-nna-ya ikpé, o nēkwutọ iwu, nēkpe kwa iwu ikpé: ma ọ buru na i nēkpe iwu ikpé, i bughi onye nēdebe iwu, kama i bu onye-ikpé-ya. Nání otù Onye bu onye nēnye iwu, buru kwa onye-ikpé, bú Onye ahu Nke puru izọputa na ila ihe n'iyì: ma gì onwe-gi bu onye, gi onye nēkpe onye-ab͕ata-obi-gi ikpé?