YouVersion Logo
Search Icon

Jeremaya 3:13-14

Jeremaya 3:13-14 BIU

Naanị nabata na ị bụ onye ikpe mara, na i nupula isi megide ONYENWE ANYị, bụ Chineke gị. Kwupụta na i werela onwe gị kesara ndị mba ọzọ dị iche iche nʼokpuru osisi ndụ niile, na ị jụkwara irubere m isi.’ ” Otu a ka ONYENWE ANYị kwupụtara. “Lọghachinụ unu ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi,” ka ONYENWE ANYị kwupụtara, sị, “nʼihi abụ m di unu. M ga-ahọrọ unu, otu onye site nʼotu obodo na mmadụ abụọ site nʼotu agbụrụ. M ga-akpọghachi unu Zayọn.