YouVersion Logo
Search Icon

Jeremaya 28:15-16

Jeremaya 28:15-16 BIU

Mgbe ahụ, Jeremaya onye amụma sịrị Hananaya onye amụma, “Gee ntị, Hananaya! Ọ bụghị ONYENWE ANYị zitere gị, ma ị ghọgbuola mba a mee ka ha tụkwasị uche nʼokwu ụgha. Nʼihi nke a, otu a ka ONYENWE ANYị kwuru, ‘Ekpebiela m isite nʼụwa wepụ gị. Ị ga-anwụ nʼafọ a, nʼihi na i kwusaala nnupu isi megide ONYENWE ANYị.’ ”