YouVersion Logo
Search Icon

Jeremaya 23:5-6

Jeremaya 23:5-6 BIU

“Ụbọchị ndị ahụ na-abịa,” ka ONYENWE ANYị kwupụtara, “mgbe m ga-eme ka Ngalaba na-eme ezi omume bilie nʼezinaụlọ Devid. Ọ ga-abụ Eze ga-eji amamihe chịa ndị ya. Ọ ga-eme ezi ihe, kpeekwa ikpe ziri ezi nʼala ahụ. Nʼụbọchị, ya ka a ga-azọpụta Juda, Izrel ga-ebikwa nʼudo. Nke a bụ aha a ga-akpọ ya: ONYENWE ANYị Onye Nzọpụta, bụ Ezi omume Anyị.