YouVersion Logo
Search Icon

Jeremaya 21:8-9

Jeremaya 21:8-9 BIU

“Tinyere nke a, gwanụ ndị mmadụ niile, ‘na ihe ndị a ka ONYENWE ANYị kwuru: Lee, ana m eche nʼihu unu ụzọ abụọ, ụzọ na-eduba na ndụ, na ụzọ na-eduba nʼọnwụ. Onye ọbụla nʼime unu nọgidere nʼobodo a ka mma agha, maọbụ ụnwụ, maọbụ ihe otiti ga-egbu. Ma onye ọbụla nʼime unu pụkwuru ndị Kaldịa gbara obodo unu gburugburu, were onwe ya nyefee ha nʼaka, ga-adị ndụ; ọ ga-echebekwa ndụ ya.