YouVersion Logo
Search Icon

Ọpụpụ 15:23-25

Ọpụpụ 15:23-25 BIU

Mgbe ha ruru Mara, ha enweghị ike ịṅụ mmiri dị nʼebe ahụ, nʼihi na mmiri ahụ na-elu ilu. (Ọ bụ ilu ilu a mere e ji kpọọ ya Mara.) Nʼebe a, ụmụ Izrel malitere itamu ntamu, megide Mosis sị, “Olee mmiri anyị ga-aṅụ?” Mosis tikuru ONYENWE ANYị mkpu akwa. ONYENWE ANYị gosiri Mosis osisi ọ ga-atụnye nʼime mmiri ahụ. Mgbe Mosis mere otu a, mmiri ahụ malitere ịdị ụtọ ọṅụṅụ. Ọ bụkwa na Mara ka ONYENWE ANYị nọ nye ha ụkpụrụ ya na iwu ya maka iji ya nwalee ha.