YouVersion Logo
Search Icon

Ọpụpụ 10:13-14

Ọpụpụ 10:13-14 BIU

Ya mere, Mosis setịpụrụ mkpanaka ya nʼelu ala Ijipt, ONYENWE ANYị mere ka ifufe nke si nʼebe anyanwụ si awa fee nʼụbọchị ahụ niile na abalị ahụ niile. Nʼụtụtụ ya, ifufe ahụ si nʼebe anyanwụ si awa bubatara igurube ndị ahụ. Ha niile kpuchichara ala Ijipt niile, site nʼotu akụkụ ruo nʼakụkụ nke ọzọ. Nke a bụ mbata igurube kachasị ibe ya njọ nʼIjipt. Ijipt agaghị enwekwa nke dịka ya ọzọ.

Free Reading Plans and Devotionals related to Ọpụpụ 10:13-14