1
MATIU 7:7
Bible Nso
Riọnu, agēnye kwa unu; chọnu, unu gāchọta kwa; kuanu, agēmeghe-kwa-ra unu
Compare
Explore MATIU 7:7
2
MATIU 7:8
n'ihi na onye ọ bula nke nāriọ nāriọta; onye nāchọ kwa nāchọta; onye nāku kwa ka agēmeghere.
Explore MATIU 7:8
3
MATIU 7:24
Ya mere onye ọ bula nke nānu okwum ndia, nēme kwa ha, agēji ya tuyere nwoke nwere uche, onye wuru ulo-ya n'elu oké nkume
Explore MATIU 7:24
4
MATIU 7:12
Ya mere ihe nile, ka ha ra, bú nke unu nāchọ ka madu nēme unu, nēme-kwa-nu madu otú a, unu onwe-unu: n'ihi na nka bu iwu na ndi-amuma Chineke.
Explore MATIU 7:12
5
MATIU 7:14
N'ihi na warara ka ọnu-uzọ ahu di, nkpagide ka uzọ ahu di kwa, nke nēdubà na ndu, ole-na-ole ka ha di kwa, bú ndi nāchọta ya.
Explore MATIU 7:14
6
MATIU 7:13
Sinu n'ọnu-uzọ di warara bà: n'ihi na obosara ka ọnu-uzọ ahu di, mbara ka uzọ ahu di kwa, nke nēdubà n'ila-n'iyì, ọtutu ka ha di kwa, bú ndi nēsi na ya nābà.
Explore MATIU 7:13
7
MATIU 7:11
Ya mere, ọ buru na unu onwe unu, ọ bu ezie na unu jọrọ njọ, ma unu nāmata inye umu-unu ezi onyinye, Nnà-unu Nke bi n'elu-igwe gēsi aṅa ghara iwere kari ezi ihe nke-uku nye ndi nāriọ Ya?
Explore MATIU 7:11
8
MATIU 7:1-2
Unu ekpela ikpé, ka aghara ikpe unu ikpé. N'ihi na ikpé unu ji kpe ka agēji kpe unu: ọ bu kwa ihe unu ji tù ihe ka agēji tùru unu.
Explore MATIU 7:1-2
9
MATIU 7:26
Ma onye ọ bula nke nānu okwum ndia, ma ọ dighi-eme ha, agēji ya tuyere nwoke nke bu onye-nzuzu, onye wuru ulo-ya n'elu ájá
Explore MATIU 7:26
10
MATIU 7:3-4
Ma gini mere i ji le irighiri ahihia nke di n'anya nwa-nna-gi, ma i tugharighi uche na ntuhie nke di n'anya nke gi? Ma-ọbu ì gēsi aṅa si nwa-nna-gi, Kwe ka m'tupu irighiri ahihia ahu n'anya-gi: ma le, ntuhie ahu di n'anya nke gi?
Explore MATIU 7:3-4
11
MATIU 7:15-16
Nēzenu ndi-amuma ugha, ndi nābiakute unu n'ihe-oyiyi aturu, ma n'ime ha bu agu nāpunara aturu. Unu gēsite na nkpuru-ha mazu ha. Màdu nēkpokọputa nkpuru-vine n'ogwu, ma-obu fig n'uké?
Explore MATIU 7:15-16
12
MATIU 7:17
Otú a ezi osisi ọ bula nāmi nkpuru ọma; ma osisi nābaghi n'ihe nāmi ajọ nkpuru.
Explore MATIU 7:17
13
MATIU 7:18
Ezi osisi apughi imi ajọ nkpuru, osisi nābaghi n'ihe apughi kwa imi nkpuru ọma.
Explore MATIU 7:18
14
MATIU 7:19
Anēb͕utu osisi ọ bula nke nāmighi nkpuru ọma, tubà kwa ya nime ọku.
Explore MATIU 7:19
Home
Bible
Plans
Videos