1
NDI-HIBRU 4:12
Bible Nso
N'ihi na okwu Chineke di ndu, nālusi kwa ọlu ike, di kwa nkọ kari mma-agha ọ bula nke nwere iru abua, nādu kwa rue n'ikewa nkpuru-obi na mọ, ma njikọta ma umi, buru kwa ihe nwere ike ituputa èchichè na izù nile nke obi.
Compare
Explore NDI-HIBRU 4:12
2
NDI-HIBRU 4:16
Ya mere ka ayi were nkwuwa-okwu biarue oche-eze amara, ka ewe mere ayi ebere, ka ayi we hu kwa amara iyere ayi aka n'oge nkpà.
Explore NDI-HIBRU 4:16
3
NDI-HIBRU 4:15
N'ihi na ayi enweghi onye-isi-nchu-àjà onye nāpughi iji obi so ayi hukọ ahuhu n'adighi-ike-ayi; kama ayi nwere Onye anwaworo n'ihe nile n'otù uzọ ahu anānwa ayi, ma O mehieghi.
Explore NDI-HIBRU 4:15
4
NDI-HIBRU 4:13
Ọ dighi kwa ihe ekère èkè nke nāputaghi ihè n'iru Ya: kama ihe nile b͕a ọtọ buru kwa ihe emegheworo n'anya-Ya, bú Onye ayi gākọrọ akukọ bayere omume-ayi.
Explore NDI-HIBRU 4:13
5
NDI-HIBRU 4:14
Ya mere ebe ayi nwere Onye-isi-nchu-àjà di uku, Onye gabigaworo eluigwe nile, bú Jisus Ọkpara Chineke, ka ayi jidesie nkwuputa-ayi ike.
Explore NDI-HIBRU 4:14
6
NDI-HIBRU 4:11
Ya mere ka ayi nānu ọku n'obi ibà n'izu-ike ahu, ka onye ọ bula ghara ida n'otù ihe-nṅomi ahu nke ekweyeghi-ekweye.
Explore NDI-HIBRU 4:11
YouVersion uses cookies to personalize your experience. By using our website, you accept our use of cookies as described in our Privacy Policy
Home
Bible
Plans
Videos