1
EKLISIASTIS 11:9
Bible Nso
Ṅuria, nwa-okorọbia, na nwata i bu; ka obi-gi me kwa gi nma n'ubọchi nile nke okorọbia i bu, je kwa ije n'uzọ nile nke obi-gi, na n'ọhuhu-uzọ nke anya-gi abua: ma mara na n'ihi ihe ndia nile Chineke gēme ka i ba n'ikpé.
Compare
Explore EKLISIASTIS 11:9
2
EKLISIASTIS 11:10
Ma wezuga nkpasu-iwe n'obi-gi, me kwa ka ihe ọjọ si n'anu-aru-gi gabiga: n'ihi na okorọbia na mb͕e-dìnkpà bu ihe-efu.
Explore EKLISIASTIS 11:10
3
EKLISIASTIS 11:4
Onye nāriba ifufe ama agaghi-agha nkpuru; ọzọ, onye nēlekwasi igwe-oji anya agaghi-ewe ihe-ubi.
Explore EKLISIASTIS 11:4
4
EKLISIASTIS 11:5
Dika i nēsighi ma ihe bu uzọ ifufe, ma-ọbu otú ọkpukpu nile si etó n'afọ nwanyi di ime; ọbuná otú a i dighi-ama ọlu Chineke Nke nēme ha nile.
Explore EKLISIASTIS 11:5
5
EKLISIASTIS 11:6
Gha nkpuru-gi n'ututu, ewepu-kwa-la aka-gi n'anyasi: n'ihi na i dighi-ama nke gāgazi agazi, ma ọ bu nka ma-ọbu nke-ọzọ, ma-ọbu na ha abua gādi nma otù aka ahu.
Explore EKLISIASTIS 11:6
6
EKLISIASTIS 11:2
Nye asa òkè, e, nye kwa asatọ; n'ihi na i maghi ihe ọjọ di aṅa gādi n'uwa.
Explore EKLISIASTIS 11:2
Home
Bible
Plans
Videos