1
I. NDI KỌRINT 15:58
Bible Nso
Ya mere, umu-nnam m'huru n'anya, guzosienu ike, burunu ndi anāpughi iropu eropu, ndi nālubiga ọlu Onye-nwe-ayi ókè mb͕e nile, ebe unu matara na ndọb͕u unu nādọb͕u onwe-unu n'ọlu abughi ihe-efu nime Onye-nwe-ayi.
Compare
Explore I. NDI KỌRINT 15:58
2
I. NDI KỌRINT 15:57
ma ekele diri Chineke, Onye nēnye ayi nmeri site n'aka Onye-nwe-ayi Jisus Kraist.
Explore I. NDI KỌRINT 15:57
3
I. NDI KỌRINT 15:33
Unu ekwela ka eduhie unu: Nkparita nile ọjọ nēmebi omume ọma.
Explore I. NDI KỌRINT 15:33
4
I. NDI KỌRINT 15:10
Ma site n'amara Chineke abum ihe m'bu: ahu-kwa-ra na amara-Ya nke enyerem abughi ihe-efu; kama adọb͕ubigaram onwem ókè n'ọlu kari ha nile: ma ọ bughi mu onwem, kama amara Chineke nke sorom.
Explore I. NDI KỌRINT 15:10
5
I. NDI KỌRINT 15:55-56
Ọnwu, òle ebe nmeri-gi di? Ọnwu, òle ebe ihe-ọb͕ub͕a-gi di? Ihe-ọb͕ub͕a nke ọnwu bu nmehie; ike nke nmehie bu kwa iwu
Explore I. NDI KỌRINT 15:55-56
6
I. NDI KỌRINT 15:51-52
Le, agwam unu ihe-omimi: Ọ bughi ayi nile gāda n'ura ọnwu, ma agēnwo ayi nile, n'oge dikarisiri ntà, n'otù ntabi-anya, mb͕e agāfù opì ikpe-azu: n'ihi na agāfù opì, agēme kwa ka ndi nwuru anwu si n'ọnwu bilie nāpughi ire uré, agēnwo kwa ayi onwe-ayi.
Explore I. NDI KỌRINT 15:51-52
7
I. NDI KỌRINT 15:21-22
N'ihi na ebe ọnwu sitere n'aka madu, nbilite-n'ọnwu nke ndi nwuru anwu site-kwa-ra n'aka madu. N'ihi na dika ọnwu diri madu nile nime Adam, ọ bu kwa otú a ka agēme ka madu nile di ndu nime Kraist ahu.
Explore I. NDI KỌRINT 15:21-22
8
I. NDI KỌRINT 15:53
N'ihi na aru a nke puru ire uré aghaghi iyikwasi ereghi-uré, aru a nke puru inwu anwu aghaghi iyikwasi anwughi-anwu.
Explore I. NDI KỌRINT 15:53
9
I. NDI KỌRINT 15:25-26
N'ihi na Ọ ghaghi ibu eze, rue mb͕e Ọ gēdebewori ndi-iro-Ya nile n'okpuru ukwu-Ya. Dika onye-iro ikpe-azu, agaje ime ka ọnwu ghara idi irè.
Explore I. NDI KỌRINT 15:25-26
Home
Bible
Plans
Videos