1
I. NDI KỌRINT 12:7
Bible Nso
Ma anēnye madu nile n'otù n'otù n'etiti ayi ngosi nke Mọ Nsọ ka o we ba urù.
Compare
Explore I. NDI KỌRINT 12:7
2
I. NDI KỌRINT 12:27
Ma unu onwe-unu bu aru nke Kraist, buru kwa ihe di n'aru, onye ọ bula n'akuku nke ya.
Explore I. NDI KỌRINT 12:27
3
I. NDI KỌRINT 12:26
Ọ buru kwa na otù ihe nke di n'aru nāhu ahuhu, ihe nile di n'aru ahu soro ya nāhukọ ahuhu; ọ buru kwa na anēnye otù ihe di n'aru otuto, ihe nile di n'aru ahu soro ya ṅurikọ ọṅu.
Explore I. NDI KỌRINT 12:26
4
I. NDI KỌRINT 12:8-10
N'ihi na anēsite n'aka Mọ Nsọ nye otù onye okwu amam-ihe; anēnye kwa onye ọzọ okwu ọmuma, di ka Mọ ahu nāchọ: nye kwa ibe-ya okwukwe, nime otù Mọ ahu; nye kwa onye ọzọ onyinye-amara nile ime ka aru madu di ike, nime otù Mọ nka; nye kwa onye ọzọ nluputa nke ọlu di ike; nye kwa onye ọzọ obubu-amuma; nye kwa onye ọzọ itule mọ di iche iche; nye kwa ibe-ya aha asusu di iche iche; nye kwa onye ọzọ isughari asusu
Explore I. NDI KỌRINT 12:8-10
5
I. NDI KỌRINT 12:11
ma ihe ndia nile ka otù Mọ ahu nālusi ike, nání Ya, nēkère madu nile n'otù n'otù, ebe onye ọ bula nọ O kère ya dika Ọ nāchọ.
Explore I. NDI KỌRINT 12:11
6
I. NDI KỌRINT 12:25
ka nkewa we ghara idi n'aru; kama ka ihe di n'aru we nēcheb͕u onwe-ha nye ibe-ha n'otù uzọ ahu.
Explore I. NDI KỌRINT 12:25
7
I. NDI KỌRINT 12:4-6
Ma òkìkè nke onyinye-amara di, ma ọ bu otù Mọ Nsọ ahu. Òkìkè nke ije-ozi di kwa, otù Onye-nwe-ayi ahu di kwa. Òkìkè ihe alutaworo n'ọlu di kwa, ma ọ bu otù Chineke ahu, Onye nālusi ihe nile ike nime ayi nile.
Explore I. NDI KỌRINT 12:4-6
8
I. NDI KỌRINT 12:28
Chineke debe-kwa-ra ufọdu nime nzukọ-Ya, nke-mbu ndi-ozi, nke-abua ndi-amuma, nke-atọ ndi-ozizí, nke so ha ọlu di ike, nke so ha onyinye-amara di iche iche ime ka aru madu di ike, iye-aka, ichi-isi, aha asusu di iche iche.
Explore I. NDI KỌRINT 12:28
9
I. NDI KỌRINT 12:14
N'ihi na aru-ayi abughi nání otù ihe nke di ya nime, kama ọ bu ọtutu ihe.
Explore I. NDI KỌRINT 12:14
10
I. NDI KỌRINT 12:22
Kama ọ bu ihe ahu di n'aru nke anēchè na ha adighi ike kari bu ihe di nkpà kari nke-uku
Explore I. NDI KỌRINT 12:22
11
I. NDI KỌRINT 12:17-19
Ọ buru na aru dum bu anya, òle ebe ka ihe-ọnunu di? Ọ buru na aru dum bu ihe-ọnunu, òle ebe ka ihe inu isìsì di? Ma otú ọ di, Chineke debere ihe di n'aru, ha nile n'otù n'otù, nime aru, dika Ọ chọrọ. Ma asi na ha nile bu otù ihe di n'aru, òle ebe ka aru di?
Explore I. NDI KỌRINT 12:17-19
Home
Bible
Plans
Videos